Abụ Ọma 112
Ụgwọ ọrụ nke onye ezi omume 
 1 Toonu Onyenwe anyị. 
Onye a gọziri agọzi ka nwoke ahụ bụ onye na-atụ egwu Onyenwe anyị; 
onye na-enwe oke mmasị idebe iwu ya niile. 
 2 Ụmụ ya ga-abụ ndị dị ike nʼala ahụ; 
ọgbọ ndị na-eme ihe ziri ezi ga-abụ ndị a gọziri agọzi. 
 3 Akụnụba na-adịgide nʼụlọ ya; 
ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. 
 4 Ìhè na-enwuru ndị na-eme ihe ziri ezi, ọ bụladị nʼime ọchịchịrị, 
nyekwa ndị na-eme amara, ndị obiọma na ndị ezi omume. 
 5 Ihe ọma ga-abịara onye ahụ na-eme ebere na-ejikwa obi ya agbazinye ndị mmadụ ihe, 
onye na-eji ikpe ziri ezi arụ ọrụ ya niile. 
 6 Nʼezie, agaghị ewezuga ya nʼọnọdụ ya; 
a ga-echeta onye ezi omume ruo mgbe ebighị ebi. 
 7 Ọ gaghị atụ egwu akụkọ ọjọọ; 
obi ya na-eguzosi ike, na-atụkwasị Onyenwe anyị obi. 
 8 Obi ya siri ike, ọ gaghị atụ egwu ihe ọbụla; 
nʼikpeazụ, ọ ga-ele ndị na-akpọ ya asị anya na mmeri. 
 9 Ọ gbasapụrụ aka ya nye ndị ogbenye onyinye dị iche iche, 
ezi omume ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; 
a ga-ewere nsọpụrụ welie mpi ya elu. 
 10 Iwe ga-ewe onye ajọ omume mgbe ọ ga-ahụ ya, 
ọ ga-atagide ikikere eze tutu ọ nwụọ; 
olileanya niile nke ndị ajọ omume ga-ala nʼiyi.