Abụ Ọma 104
Toonu Chineke onye okike 
 1 Mkpụrụobi m, too Onyenwe anyị. 
O Onyenwe anyị na Chineke m, ị dị ukwu nke ukwuu; 
ị na-eyikwasị ịma mma na ebube dịka uwe. 
 2 Ọ na-eji ìhè kpuchie onwe ya dịka akwa; 
ọ na-agbasa eluigwe dịka ụlọ ikwu 
 3 na-atọ ntọala ụlọ elu ya nʼelu mmiri.* 104:3  Ems 9:6 
Ọ na-eji igwe ojii emere onwe ya ụgbọ agha 
na-ejirikwa nku nke ifufe felie elu. 
 4 O ji oke ifufe mere ihe na-ejere ya ozi, 
meekwa ka ọkụ na-enwu enwu bụrụ ndị na-ejere ya ozi. 
 5 Ọ bụ ya tọrọ ntọala ụwa; 
agaghị ewezugakwa ya site nʼọnọdụ ya. 
 6 I gbokwasịrị ogbu mmiri nʼelu ya dịka ọ bụ uwe ka i yikwasịrị ya, 
mmiri tokpukwara ugwu niile. 
 7 Ma mgbe ị bara mba, mmiri ahụ gbapụrụ, 
nʼụda oke olu nke egbe eluigwe gị, ha gbapụrụ ọsọ. 
 8 Ha sitere nʼelu ugwu niile, 
sọrọ gaa na ndagwurugwu, 
ruokwa nʼebe ahụ ị kpara oke na ha ga-anọ. 
 9 Ị kpara oke nye ha, nke ha na-agaghị agafe, 
gbochie ha ikpuchi elu ụwa ọzọ. 
 10 Ọ na-eme ka mmiri, site nʼala na-asọpụta na ndagwurugwu, 
meekwa ka iyi niile site nʼetiti ugwu na-asọfe. 
 11 Ha na-enye anụ ọhịa niile mmiri ọṅụṅụ 
bụrụkwa ebe akpịrị ịkpọ nkụ nke ịnyịnya ibu ọhịa na-adajụ. 
 12 Nʼosisi dị nʼakụkụ ha ka ụmụ anụ ufe nke eluigwe ga-anọ wuo akwụ ha; 
nọrọkwa nʼalaka ha bụọ abụ. 
 13 Ọ na-esite nʼeluigwe na-ezidata mmiri ozuzo nʼelu ugwu niile; 
ụwa niile na-ejupụtakwa na mkpụrụ nke ọrụ aka ya. 
 14 Ọ na-eme ka ahịhịa puputara anụ ụlọ, 
na-emekwa ka ihe a kụrụ nʼala puoro mmadụ nʼubi ya, 
ime ka nri site nʼala pupụta; 
 15 mmanya nke na-enye obi mmadụ aṅụrị, 
mmanụ nke na-eme ka ihu na-egbupụ amụma, 
na achịcha nke na-enye ya ume nʼobi. 
 16 A na-agba osisi niile nke Onyenwe anyị mmiri nke ọma, 
osisi sida nke Lebanọn nke ọ kụrụ. 
 17 Ụmụ nnụnụ na-ewu akwụ ha; 
nʼosisi fịa ka ụgbala na-ewu akwụ ya. 
 18 Ugwu niile dị elu dịịrị ewu ọhịa; 
nʼọgba dị na nkume ka ewi nkume na-ezo onwe ha. 
 19 I mere ọnwa ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-agụ oge na mgbe dị iche iche; 
anyanwụ makwaara mgbe ọ ga-eji daa. 
 20 Ị na-eme ka ọchịchịrị bịa, ọ bụrụ abalị; 
ụmụ anụ ọhịa niile nke oke ọhịa na-akpagharị. 
 21 Ụmụ ọdụm na-agbọ ụja ha na-elegharị anya anụ ha ga-adọgbu, 
ịchọrọ onwe ha ihe oriri ahụ Chineke na-enye ha. 
 22 Nʼisi ụtụtụ mgbe anwụ wara, 
ha na-alaghachi zoo onwe ha nʼebe nzuzo ha. 
 23 Ụmụ mmadụ na-amalitekwa ọrụ ha nʼisi ụtụtụ, 
kwụsịkwa nʼanyasị mgbe ọchịchịrị bidoro ịgba. 
 24  Onyenwe anyị, ọrụ aka gị dị ọtụtụ. 
Ọ bụ site nʼamamihe ka i ji kee ha. 
Elu ụwa niile jupụtara nʼihe niile i kere eke. 
 25 Leenụ osimiri nke buru ibu saakwa mbara; 
jupụtara nʼihe e kere eke na-akpụ akpụ nke a na-apụghị ịgụta ọnụ bi, 
anụ dị ndụ ma ndị ukwu ma ndị nta. 
 26 Nʼebe ahụ ka ụgbọ mmiri niile na-ejegharị, 
nʼime ya kwa ka leviatan, nke gị onwe gị kere, na-anọ egwuri egwu. 
 27 Ha niile na-adabere na gị, 
ka i nye ha nri nʼotu nʼotu, mgbe oge iri nri ha ruru. 
 28 Ị na-enye ha nri; 
ha na-erikwa ya. 
Mgbe i meghere ọbụ aka gị nye ha nri, 
afọ na-eju ha nke ọma. 
 29 Mgbe i zonarịrị ha ihu gị, 
egwu na-eju ha obi. 
Mgbe ị napụkwara ha ume ndụ i nyere ha, 
ha na-ekubi ume, nwụọ, laghachikwa nʼaja ebe ha siri pụta. 
 30 Mgbe i zipụrụ mmụọ gị, 
a na-eke ha; 
ị na-agbanwekwa ihu elu ụwa. 
 31 Ka ebube Onyenwe anyị dịgide site nʼebighị ebi ruo nʼebighị ebi; 
ka ọrụ aka Onyenwe anyị niile wetara ya ọṅụ, 
 32 onye na-ele ụwa anya, ụwa amaa jijiji, 
onye na-emetụ ugwu niile aka, ha na-akwụ anwụrụ ọkụ. 
 33 Aga m abụku Onyenwe anyị abụ ogologo ụbọchị niile nke ndụ m; 
aga m abụku Chineke m abụ otuto oge niile m na-adị ndụ. 
 34 Ka ntụgharị uche m niile bụrụ ihe na-atọ ya ụtọ, 
dịka m na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị. 
 35 Ka e kpochapụ ndị mmehie niile site nʼụwa. 
Ka ndị niile na-emebi iwu gharakwa ịdị ọzọ. 
Too Onyenwe anyị gị mkpụrụobi m! 
Toonu Onyenwe anyị!