Abụ Ọma 89
Abụ maskil nke Etan, onye Ezra. 
Ọgbụgba ndụ Chineke na Devid 
 1 Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi; 
aga m eji ọnụ m mee ka ọgbọ niile mara 
maka ikwesi ntụkwasị obi gị. 
 2 Aga m ekwupụta na ịhụnanya gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; 
na i mere ka ikwesi ntụkwasị obi gị, guzosie ike nʼeluigwe. 
 3 Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ. 
Aṅụọkwala m iyi nye ohu m Devid sị, 
 4 ‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi 
meekwa ka ocheeze gị dịgide ruo ọgbọ niile.’ ” 
Sela
  5 O Onyenwe anyị, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile, 
na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼetiti nzukọ ndị dị nsọ. 
 6 Nʼihi, ọ bụ onye nʼeluigwe niile, ka a ga-eji tụnyere Onyenwe anyị? 
Onye yiri Onyenwe anyị nʼetiti ndị mmụọ ozi niile? 
 7 Na nzukọ ndị nsọ, Chineke bụ onye a na-atụ oke egwu; 
ọ dị oke egwu karịa ndị niile gbara ya gburugburu. 
 8 O Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, onye dịka gị? 
Gị, O Onyenwe anyị, dị ike nke ukwuu, ikwesi ntụkwasị obi gị na-agba gị gburugburu. 
 9 Ị na-achị osimiri nke ji ike na-asọ; 
mgbe ebili mmiri ya na-amali elu; i na-eme ka ha dajụọ. 
 10 Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu; 
jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị. 
 11 Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa, 
ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya. 
 12 Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda; 
Taboa na Hemon na-abụ abụ ọṅụ nʼihi aha gị. 
 13 Aka gị ka e mejupụtara nʼike; 
aka gị dị ike, a na-ebuli aka nri gị elu. 
 14 Ezi omume na ikpe ziri ezi, bụ ntọala ocheeze gị; 
ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, na-aga nʼihu gị. 
 15 Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ ndị na-eji olu iti mkpu ọṅụ na-abụku gị abụ, 
ndị na-ejegharịkwa nʼìhè nke ihu gị, O Onyenwe anyị. 
 16 Ha na-aṅụrị ọṅụ nʼaha gị ogologo ụbọchị niile; 
ha na-aṅụrị nʼezi omume gị. 
 17 Nʼihi na ị bụ ebube na ike ha, 
site nʼihuọma gị, ị na-ebuli mpi anyị elu. 
 18 Nʼezie, ọta anyị bụ nke Onyenwe anyị, 
eze anyị bụkwa nke Onye nsọ Izrel. 
 19 I kwuru okwu otu mgbe site nʼọhụ, 
nye ndị gị kwesiri ntụkwasị obi sị: 
“Enyela m otu onye dị ike agha ike; 
Ebuliela m otu nwa okorobịa elu site nʼetiti ndị m. 
 20 Achọtala m Devid ohu m, 
were mmanụ nsọ m tee ya. 
 21 Aka m ga-agba ya ume; 
nʼezie, aka m ga-eme ka ọ dị ike. 
 22 Ọ dịghị onye iro ga-abịakwasị ya, na mberede; 
ọ dịghị onye ajọ omume ga-emegbu ya. 
 23 Aga m etigbu ndị iro ya niile nʼihu ya. 
Aga m emekwa ka ndị niile na-akpọ ya asị laa nʼiyi. 
 24 Ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi ga-adịnyere ya, 
site nʼaha m, a ga-ebuli mpi ya elu. 
 25 M ga-edo aka ya nʼoke osimiri,* 89:25 Ọ ga-achị oke osimiri na osimiri niile 
dokwaa aka nri ya nʼosimiri niile.† 89:25 Oke osimiri na osimiri niile a na-ekwu banyere ha nʼebe a, bụ osimiri Mediterenịa na Yufretis, na osimiri ndị ọzọ niile na-asọbanye nʼime ha. Oke ala ochie ahụ e kwere Devid na Solomọn na nkwa jedebere nʼosimiri ndị a. 
 26 Ọ ga-akpọ m sị m, ‘Ị bụ Nna m, 
bụrụkwa Chineke m, na oke Nkume nzọpụta m.’ 
 27 Aga m eme ya nwa mbụ m, 
onye kachasị dị elu nʼebe eze niile nke ụwa nọ. 
 28 Aga m eme ka ịhụnanya m nwere nʼebe ọ nọ dịgide ruo ebighị ebi, 
ọgbụgba ndụ mụ na ya ga-adịgidekwa. 
 29 Aga m eme ka agbụrụ ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi, 
ocheeze ya ga-adịgidekwa dịka eluigwe na-adịgide. 
 30 “Ọ bụrụ na ụmụ ya elefuo iwu m niile anya, 
gharakwa ijegharị nʼụzọ m niile, 
 31 ọ bụrụ na ha elelịa ụkpụrụ m niile anya, 
hapụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu, 
 32 aga m eji mkpọrọ taa ha ahụhụ maka mmehie ha, 
tikwaa ha ụtarị maka njehie ha; 
 33 ma agaghị m ewezuga ịhụnanya m, nʼebe ha nọ. 
Ma ọ bụ laa azụ nʼikwesị ntụkwasị obi m. 
 34 Agaghị m emerụ ọgbụgba ndụ m. 
Agakwaghị m agbanwe ihe ọbụla siterela nʼọnụ m pụta. 
 35 Ejirila m ịdị nsọ m ṅụọ iyi, kpebie 
na m apụghị ịghara Devid ụgha, 
 36 na agbụrụ ya ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, 
ocheeze ya ga-adịgidekwa nʼihu m ka anyanwụ na-adịgide. 
 37 Ọ ga-adịgide ruo ebighị ebi dịka ọnwa. 
E, dịka ọnwa ahụ, onye akaebe m kwesiri ntụkwasị obi na mbara eluigwe.” 
Sela
  38 Ma ị jụla, i werela nlelị jụkwa, 
i na-ewe iwe dị ukwu megide onye gị e tere mmanụ. 
 39 Ị jụla ọgbụgba ndụ gị na ohu gị gbara 
i merụọla okpueze ya nʼime ntụ dị nʼala. 
 40 Ị kụtuola mgbidi gbara ya gburugburu, 
i meela ka ebe ya niile e wusiri ike bụrụ ihe dapịara adapịa. 
 41 Ndị niile si ụzọ ahụ na-agafe, ezuruchaala ihe niile o nwere. 
Ndị agbataobi ya na-akwakwa ya emo. 
 42 I meela ka aka nri ndị iro ya dị elu; 
mekwaa ka ndị iro ya ṅụrịa ọṅụ. 
 43 I meela ka aka o ji jide mma agha ya sụọ ngọngọ, 
i nyereghị ya aka mgbe agha dara. 
 44 I meela ka ịma mma ya gwụsịa. 
Ị tụdakwala ocheeze ya nʼala. 
 45 I meela ka ụbọchị ndụ nke okorobịa ya dị mkpụmkpụ. 
I ji ihere dịka akwa kpuchie ya. 
 46 Ruo ole mgbe Onyenwe anyị, ka ị ga-ezonarị onwe gị? 
Ruo ole mgbe ka iwe gị dị ukwuu ga-eregide dịka ọkụ? 
 47 Cheta, na ndụ m bụ ihe na-agafe ngwangwa. 
Nʼihi ihe efu gịnị ka i ji kee mmadụ niile! 
 48 Olee onye ahụ nwere ike ịdị ndụ ghara ịhụ ọnwụ anya, 
maọbụ zọpụta onwe ya site nʼike nke ili‡ 89:48 Ya bụ, ala mmụọ? 
Sela
  49 O Onyenwe anyị, olee ebe oke ịhụnanya mbụ dị, 
nke i sitere nʼikwesị ntụkwasị obi gị ṅụọrọ Devid nʼiyi? 
 50 Onyenwe m, cheta otu e si leda ndị ohu gị anya, 
otu m si anagide nʼime obi m ịchị ọchị niile nke ndị mba niile. 
 51 O Onyenwe anyị, ịchị ọchị nke ndị iro gị ji akwa m emo, 
nke ha ji lelịa nzọ ụkwụ niile nke onye gị i tere mmanụ. 
 52 Otuto dịrị Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi. 
Amen na Amen. 
*Abụ Ọma 89:25 89:25 Ọ ga-achị oke osimiri na osimiri niile
†Abụ Ọma 89:25 89:25 Oke osimiri na osimiri niile a na-ekwu banyere ha nʼebe a, bụ osimiri Mediterenịa na Yufretis, na osimiri ndị ọzọ niile na-asọbanye nʼime ha. Oke ala ochie ahụ e kwere Devid na Solomọn na nkwa jedebere nʼosimiri ndị a.
‡Abụ Ọma 89:48 89:48 Ya bụ, ala mmụọ