Abụ Ọma 88
Abụ, bụ Abụ Ọma ụmụ Kora, nke dịrị onyeisi Abụ. Nʼusoro olu abụ Mahalat leannot. Abụ Maskil nke Heman onye Ezra. 
Akwa maka enyemaka 
 1 O Onyenwe anyị, Chineke onye na-azọpụta m, 
nʼehihie na abalị ka m na-eti mkpu akwa nʼihu gị. 
 2 Ka ekpere m bịa nʼihu gị. 
Chee ntị gị nụrụ akwa m. 
 3 Nʼihi na ọtụtụ nsogbu ejupụtala mkpụrụobi m, 
anọ m nso nʼọnụ ụzọ ọnwụ. 
 4 Agụnyela m nʼetiti ndị na-arịda nʼolulu. 
Adị m dịka onye na-enweghị ike. 
 5 A họpụtara mụ na ndị nwụrụ anwụ iche, 
dịka ndị e gburu egbu na-edina nʼili, 
ndị ị nakwaghị echeta ọzọ, 
ndị e kewapụrụ site na nlekọta gị. 
 6 Ị tụbanyela m nʼime olulu dịkarịrị omimi, 
olulu nke ọchịchịrị jupụtara nʼime ya. 
 7 Oke iwe gị na-anyịgide m nke ukwuu; 
i jirila ebili mmiri gị niile kpuchigide m. 
Sela
  8 Ị napụla m ndị enyi m, ndị m hụrụ nʼanya, 
mee ka m bụrụ ihe a na-asọ oyi nʼebe ha nọ. 
Abụ m onye emechibidoro ụzọ; nke nʼenweghị ike ịpụ ezi; 
 9 anya m adịghị ahụkwa ụzọ nʼihi iru ụjụ. 
O Onyenwe anyị, ụbọchị niile ka m na-akpọku gị; 
ana m agbasa aka m abụọ nʼihu gị, 
 10 ọ bụ ndị nwụrụ anwụ ka ị na-egosi ọrụ ebube gị? 
Ndị nwụrụ anwụ, ha na-ebili too gị? 
Sela
  11 Ọ bụ nʼime ili ka a na-ekwupụta ịhụnanya gị? 
A na-ekwupụta ikwesi ntụkwasị obi gị nʼebe ịla nʼiyi? 
 12 A na-amata banyere ọrụ ebube gị nʼebe ọchịchịrị dị? 
Ma ọ bụ ọrụ ezi omume gị, na ịdị mma gị niile nʼala ndị e chezọrọ echezọ? 
 13 Ma Onyenwe anyị m, ọ bụ gị ka m na-akpọku. 
Ụtụtụ niile ka ekpere m ga na-abịa nʼebe ị nọ. 
 14 O Onyenwe anyị, gịnị mere i jiri jụ m? 
Gịnị mekwara i jiri zonarị m ihu gị? 
 15 Site na mgbe okorobịa m, abụ m onye a na-esogbu, onye nọkwa ọnwụ nso; 
ataala m ahụhụ oke ụjọ gị, anọ m nʼọnọdụ ịda mba. 
 16 Oke iwe gị agabigala nʼahụ m; 
ihe egwu gị alaala m nʼiyi. 
 17 Ha na-agba m gburugburu ụbọchị niile dịka idee mmiri; 
ha gbara m gburugburu nʼakụkụ niile. 
 18 Ị napụla m ndị enyi m na ndị m hụrụ nʼanya; 
ọchịchịrị bụ enyi m nọkarịsịrị m nso.