Abụ Ọma 77
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Maka Jedutun. Abụ nke Asaf. Abụ Ọma. 
Nkasiobi nʼoge nsogbu 
 1 Etikuru m Chineke nʼoke olu maka enyemaka; 
etikuru m Chineke mkpu ka ọ nụrụ olu m. 
 2 Mgbe m nọ nʼihe mgbu, ọ bụ Onyenwe anyị ka m chọrọ. 
Nʼanyasị, esetipụrụ m aka m abụọ, ike na-agwụghị, 
mmụọ m jụkwara ka a akasịe ya obi. 
 3 O Chineke, echetara m gị, sụkwaa ude; 
echere m echiche, mkpụrụobi m dakwara mba. 
Sela
  4 I kweghị ka anya m abụọ mechie; 
nʼihi oke mwute m, enweghị m ike kwuo okwu. 
 5 Echere m echiche banyere ụbọchị niile gara aga, 
na afọ niile ndị gara aga. 
 6 Echetara m abụ niile m na-abụ nʼime anyasị. 
Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ntụgharị uche, mmụọ m jụkwara ajụjụ. 
 7 “Onyenwe anyị ọ ga-agbakụta m azụ ruo mgbe ebighị ebi? 
Ọ pụtara na ọ gaghị egosi ihuọma ya ọzọ? 
 8 Ọ pụtara na ịhụnanya ya nke na-adịgide ruo ebighị ebi agwụla? 
Ọ pụtara na nkwa ya agaghị emezu ruo ebighị ebi? 
 9 Chineke, o chefuola i mere anyị ebere? 
O jichiela ọmịiko ya nʼihi iwe?” 
Sela
  10 Mgbe ahụ, ekwuru m, “Lee ọnọdụ ọjọọ m, 
afọ niile mgbe Onye kachasị ihe niile elu setịpụrụ aka nri ya. 
 11 Aga m echeta ọrụ niile Onyenwe anyị rụrụ; 
e, aga m echeta ihe ịrịbama niile i mere nʼoge gara aga. 
 12 Aga m atụgharịa uche m nʼọrụ gị niile, 
tuleekwa ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche.” 
 13 O Chineke, ụzọ gị niile dị nsọ. 
Olee chi dị ukwuu dịka Chineke anyị? 
 14 Ị bụ Chineke onye na-arụ ọrụ ebube dị iche iche; 
ị na-egosipụta ike gị nʼetiti ụmụ mmadụ. 
 15 I ji aka gị dị ike gbapụta ndị gị, 
bụ ụmụ ụmụ Jekọb na Josef. 
Sela
  16 Osimiri hụrụ gị, O Chineke, 
osimiri hụrụ gị, taa; 
ogbu mmiri mere mkpọtụ. 
 17 Igwe ojii wụpụrụ mmiri, 
mkpọtụ egbe eluigwe jupụtara mbara eluigwe; 
àkụ gị gburu amụma ebe niile. 
 18 A nụrụ ụda egbe eluigwe gị nʼoke ifufe, 
amụma gị nyere ụwa niile ihe; 
elu ụwa niile mara jijiji, tụkwaa oke egwu. 
 19 Ọ bụ nʼosimiri ka nzọ ụkwụ gị gara, 
ụzọ gị gara nʼetiti oke osimiri, 
ọ bụ ezie na ahụghị m nzọ ụkwụ gị anya. 
 20 I sitere nʼaka Mosis na Erọn 
duo ndị gị dịka igwe atụrụ.