Abụ Ọma 47
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ ụmụ Kora. Abụ Ọma. 
Chineke bụ eze nke ụwa 
 1 Kụọnụ aka unu, unu mba niile; 
jiri iti mkpu ọṅụ tikuo Chineke. 
 2 Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke kachasị ihe niile elu. 
Ọ dị egwu! Ọ bụ eze ukwu na-achị ụwa niile. 
 3 O wedara mba niile mee ka ha nọọ nʼokpuru anyị; 
ndị mmadụ niile nọ nʼokpuru ụkwụ anyị. 
 4 Ọ họpụtaara anyị ihe nketa anyị, 
ihe ịnya isi nke Jekọb, onye ọ hụrụ nʼanya. 
Sela
  5 Chineke ewerela iti mkpu ọṅụ rigoro nʼeluigwe. 
Onyenwe anyị ewerela olu opi ike rigoo. 
 6 Bụkuonụ Chineke abụ otuto, bụọ abụ otuto; 
bụkuonụ eze anyị abụ otuto, bụọ abụ otuto.* 47:6 Ngwa egwu eji mpi anụmanụ mee, a na-akpọ Shọfa, ka eji abụ abụ. Ọ bụkwa ya ka a eji akpọsa afọ ọhụrụ nye ndị mmadụ. 
 7 Nʼihi na Chineke anyị bụ eze ụwa niile. 
Jirinụ abụ too ya. 
 8 Chineke bụ eze mba niile; 
ọ na-anọkwasị nʼocheeze ya dị nsọ na-achị mba niile. 
 9 Ndị niile a ma ama na mba niile ezukọtaala, 
dịka ndị Chineke nke Ebraham, 
nʼihi na ndị eze† 47:9 Maọbụ, ọta niile dị nʼụwa bụ nke Chineke; 
ọ bụ onye e buliri elu nʼebe ọ dị ukwuu. 
*Abụ Ọma 47:6 47:6 Ngwa egwu eji mpi anụmanụ mee, a na-akpọ Shọfa, ka eji abụ abụ. Ọ bụkwa ya ka a eji akpọsa afọ ọhụrụ nye ndị mmadụ.
†Abụ Ọma 47:9 47:9 Maọbụ, ọta