Abụ Ọma 20
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. 
Ekpere maka enyemaka 
 1 Ka Onyenwe anyị zaa gị nʼụbọchị nsogbu gị; 
ka aha Chineke nke Jekọb chebe gị. 
 2 Ya sitekwa nʼebe nsọ ya zitere gị inyeaka, 
ma site na Zayọn kwagide gị. 
 3 Ya chetakwa aja niile ị chụrụ, 
ma nabata aja nsure ọkụ niile ị chụrụ nye ya. 
Sela
  4 Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ, 
mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma. 
 5 Anyị ga-eti mkpu ọṅụ maka mmeri i meriri, 
buliekwa ọkọlọtọ anyị elu nʼaha Chineke anyị. 
Ka Onyenwe anyị mezuo arịrịọ gị niile. 
 6 Ugbu a, amaara m 
na Onyenwe anyị na-azọpụta onye ya o tere mmanụ; 
ọ na-esite nʼebe nsọ ya nʼeluigwe jiri aka nri ya, 
zọpụta ma zakwaa ya. 
 7 Ụfọdụ na-atụkwasị obi ha na ịnyịnya, ndị ọzọ nʼụgbọ agha; 
ma anyị na-atụkwasị aha Onyenwe anyị, Chineke anyị, obi. 
 8 Ha na-egbu ikpere nʼala ma daa, 
ma anyị ga-ebili, kwụrụ chịm. 
 9 O Onyenwe anyị, zọpụta eze! 
Zakwaa anyị mgbe anyị kpọkuru gị!