9
A ga-ebibi Izrel 
 1 Ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ guzo nʼakụkụ ebe ịchụ aja, ọ sịrị, 
“Tie ọnụ ogidi ndị a ihe, 
ruo mgbe mbata ọnụ ụzọ ha niile mara jijiji. 
Tipịasịa ha nʼisi mmadụ niile; 
aga m ejikwa mma agha gbuo ndị niile fọdụrụ. 
Ọ dịghị onye ga-agbapụ, 
ọ dịkwaghị onye ga-ewezuga onwe ya. 
 2 Ọ bụrụ na ha egwuo ala ruo nʼala mmụọ, 
site nʼebe ahụ ka aka m ga-esi dọlie ha, 
ọ bụrụkwa na ha arịgoruo ime eluigwe, 
site nʼebe ahụ ka m ga-esi wedata ha nʼala. 
 3 Ọ bụrụkwa na ha ezoo onwe ha nʼelu Kamel 
nʼebe ahụ ka m ga-esi chọpụta ha, kpụrụ ha, 
a sịkwa na ha ezoo onwe ha nʼala oke osimiri, 
nʼebe ahụ ka m ga-enye ajụala nke mmiri iwu ka ọ taa ha. 
 4 Ọ bụrụ na a dọta ha nʼagha mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ, 
nʼebe ahụ aga m enye mma agha iwu ka o gbuo ha. 
“Aga m elekwasị ha anya m abụọ 
nʼihi ime ha ihe ọjọọ, ọ bụghị ihe ọma.” 
 5 Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, 
onye na-emetụ ala aka mee ka ọ gbazee, 
ime ka ndị niile bi nʼala ruo ụjụ; 
ala ya niile bilie na-ebili dịka mmiri nke osimiri Naịl, 
nke na-emesịakwa dajụọ dịka mmiri Ijipt. 
 6 Onye na-ewu ụlọ elu ya nʼeluigwe niile, 
na-eme ka ntọala ya dị nʼụwa. 
Onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku, 
ma na-awụsa ha nʼala, 
aha ya bụ Onyenwe anyị. 
 7 “Ọ bụ na unu ndị Izrel 
adịghị ka ndị Kush nʼebe m nọ?” 
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 
“Ọ bụ na-esighị m nʼala Ijipt kpọpụta Izrel, 
site na Kafto kpọpụta ndị Filistia, 
ma kpọpụtakwa ndị Aram site na Kia? 
 8 “Nʼezie, anya Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dịkwasịrị 
nʼahụ alaeze ahụ nke na-emehie. 
Aghaghị m ịla ya nʼiyi, 
kpochapụ ya site nʼelu ụwa, 
naanị na m agaghị ebibicha 
ụlọ Jekọb kpamkpam.” 
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 
 9 “Ma lee, mụ onwe m gaje inye iwu, 
aga m ayọgharị ụlọ Izrel 
nʼetiti mba niile 
dịka e si ayọgharị ọka nʼime nyọ, 
ma ọ dịghị otu mkpụrụ ọka nʼime ya nke ga-ada nʼala. 
 10 Ma ndị mmehie ahụ niile nọ nʼetiti ndị m, 
ndị ahụ na-asị, ‘Mbibi agaghị erute anyị, 
anyị agaghị ezute ya, 
aghaghị ịnwụ site na mma agha.’ 
Nlọta ndị Izrel 
 11 “Nʼụbọchị ahụ, 
“aga m emekwa ka ụlọ ikwu Devid dara ada guzoziekwa. 
Aga m emezi akụkụ ya niile gbajiri agbaji, 
mee ka akụkụ ya niile dakpọsịrị adakpọsị guzozie dịka ọ dị na mbụ. 
Aga m ewugharịkwa ya, mee ka ọ dịrị ka ọ dị na mbụ. 
 12 Ka ha nwee ike inweta ndị fọdụrụ nʼEdọm 
tinyere mba niile dị iche iche bụ nke a kpọkwasịrị aha m.” 
Otu a ka Onyenwe anyị onye ga-emezu ihe ndị a niile kwubiri ya. 
 13 “Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, 
“Mgbe onye na-akọ ubi ga-agafe onye na-ewe ihe ubi, 
onye na-agha mkpụrụ ka onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị ga-agafekwa. 
Mmanya ọhụrụ ga-esitekwa nʼelu ugwu na-atapụta, 
ọ ga-esitekwa nʼugwu nta niile na-asọpụta. 
 14 Aga m emekwa ka ndị m bụ Izrel site nʼobodo a dọtara ha nʼagha lọta.* 9:14 Aga m emekwa ka ndị m Izrel nwetakwa ihe ọma niile. 
“Ha ga-ewugharị obodo niile tọgbọrọ nʼefu, birikwa nʼime ha. 
Ha ga-akụ ubi vaịnị a gbara ogige, ṅụọkwa mmanya si na ya. 
Ha ga-arụkwa ubi a gbara ogige, riekwa mkpụrụ si na ya. 
 15 Aga m akụ Izrel nʼala ha.† 9:15 Ya bụ, ime ka ha biri nʼala ha 
A gaghị ehopukwa ha ọzọ 
site nʼala ahụ bụ nke m nyere ha.” 
Ọ bụ ihe Onyenwe anyị Chineke unu kwuru.