8
Nkata mkpụrụ chara acha 
 1 Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gosiri m. Otu nkata nke mkpụrụ osisi ọkọchị chara acha jupụtara.  2 Ọ sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?” 
A sịrị m: “Otu nkata nke mkpụrụ osisi chara acha jupụtara nʼime ya.” 
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Oge ọgwụgwụ abịakwasịla ndị m, Izrel. Agaghị m ewezugakwa ntaramahụhụ dịrị ha.” 
 3 Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, “Nʼụbọchị ahụ, abụ niile nke a na-abụ nʼime ụlọnsọ ukwu ga-aghọ iti mkpu akwa. Ọtụtụ, ọtụtụ ozu ndị nwụrụ anwụ, nʼebe niile ọbụla ka atụpụsịrị ha! Mkpọtụ ọbụla adịghịkwa!”* 8:3 Ya bụ, ebe ọbụla dere juu 
 4 Nụrụnụ nke a, unu ndị na-azọpịa ndị mkpa na-akpa, 
na-emekwa ka ụmụ ogbenye dị nʼala a gwụsịa, 
 5 na-asị, 
“Olee mgbe ọnwa ọhụrụ ga-agafe 
ka anyị ree mkpụrụ ubi, 
na mgbe ụbọchị izuike ga-agwụ 
ka anyị ree ọka wiiti?” 
Ka anyị jiri ihe ọtụtụ dị nta, 
na ibuli ọnụ ngwa ahịa elu, 
na aghụghọ site nʼiji ihe ọtụtụ na-ezughị ezu. 
 6 Jiri ọlaọcha zụta ụmụ ogbenye, 
jirikwa akpụkpọụkwụ abụọ anyị zụta ndị mkpa na-akpa, 
ma reekọta ọka wiiti anyị zachatara nʼala ya na ezi ọka wiiti. 
 7  Onyenwe anyị ewerela nganga Jekọb ṅụọ iyi, “Nʼezie, agaghị m echefu, ọ bụladị otu nʼime ọrụ niile ha rụrụ.” 
 8 Ọ bụ na ala agaghị ama jijiji nʼihi nke a, 
ndị niile bi nʼime ya ha agaghị eru ụjụ? 
Ala a niile ga-etoju dịka osimiri Naịl, 
a ga-eme ka ọ magharịa malie elu, ma tachaa 
dịka iyi Ijipt. 
 9 “Ma nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya, 
“Aga m eme ka anyanwụ daa† 8:9 Ya bụ, ime ka chi jie nʼetiti ehihie, 
ime ka ọchịchịrị dịrị nʼetiti oke ehihie nke ụbọchị. 
 10 Aghaghị m ime ka ụbọchị oke oriri unu ghọọ ụbọchị iru ụjụ; 
gbanwee abụ unu niile ka ha ghọọ abụ akwa. 
Aga m eme ka onye ọbụla nʼime unu yiri akwa mkpe, 
meekwa ka unu kpụchaa isi unu. 
Aga m eme ka ụbọchị ahụ dịrị ka ụbọchị a na-eru ụjụ, nʼihi otu mkpụrụ nwa nwoke nwụrụ anwụ. 
Ọgwụgwụ ya ga-adịka ụbọchị na-elu ilu ilu. 
 11 “Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya, 
“mgbe m ga-eziga oke ụnwụ nʼelu ala, 
ọ bụghị ụnwụ nke nri maọbụ nke akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri, 
kama ọ bụ oke ụnwụ nke ịnụ okwu niile nke Onyenwe anyị. 
 12 Ha ga-awagharị site nʼotu osimiri ruo nʼosimiri ọzọ, 
sitekwa nʼugwu ruo nʼọwụwa anyanwụ; 
ha ga-agbagharị nʼelu na ala ịchọ okwu Onyenwe anyị, 
ma ha agaghị achọta ya. 
 13 “Nʼụbọchị ahụ, 
“ụmụ agbọghọ ndị mara mma ile anya, na ụmụ okorobịa ndị dị ike 
ga-ada mba nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ. 
 14 Ndị ahụ na-eji mmehie Sameria na-aṅụ iyi,‡ 8:14 Nʼaha Ashima bụ arụsị 
ndị na-asị, ‘Dịka chi gị na-adị ndụ, gị Dan,’ 
nakwa, ‘Ebe ọ bụ na chi ndị Bịasheba na-adị ndụ,’ 
ha ga-ada, ha agakwaghị ebilite ọzọ.”