Abụ nke Abụ  
 1
 1 Abụ nke abụ nke Solomọn. 
Onye a hụrụ nʼanya 
 2 Ya were nsusu niile nke ọnụ ya susuo m ọnụ, 
nʼihi na ịhụnanya gị dị ụtọ karịa mmanya. 
 3 Mmanụ otite gị niile na-esi isi ọma, 
aha gị dịka mmanụ isi ụtọ awụpụtara awụpụta, 
ọ bụghị ihe ịtụnanya na ụmụ agbọghọ hụrụ gị nʼanya. 
 4 Kpọrọ m, ka mụ na gị soro, ka anyị mee ngwangwa. 
Ka eze kpọbata m nʼime ụlọ ya. 
Ndị Enyi 
Anyị ga-aṅụrị ọṅụ nwekwa obi ụtọ nʼime gị. 
Anyị ga-eto ịhụnanya gị karịa mmanya. 
Onye a hụrụ nʼanya 
Lee nʼizi ezi ka ha nʼahụ gị nʼanya nke ukwuu. 
 5 Ana m eji nji ma a maara m mma ile anya, 
unu ụmụ agbọghọ Jerusalem. 
Adị m nji dịka ụlọ ikwu nke Keda* 1:5 Ndị Keda bụ otu ebo nʼetiti ndị Arab, obodo ha dị na ndịda ọdịda anyanwụ Edọm. Ha na-ebi nʼụlọ ikwu e ji ajị ewu ojii wuo 
dịka akwa mgbochi dị nʼụlọ Solomọn. 
 6 Unu elekwasịla m anya, maka na m na-eji nji. 
Ọ bụ anwụ gbajiri m. 
Ụmụnne m ndị ikom were iwe megide m, 
zipụ m nʼezi ilekọta ubi vaịnị anyị, 
ma ubi vaịnị nke m ka m na-elekọtaghị. 
 7 Gwa m, gị onye m hụrụ nʼanya, 
ebee ka anụ ụlọ gị na-ata nri? 
Ebee ka atụrụ gị na-ezu ike nʼetiti ehihie? 
Nʼihi gị ka m ga-eji dịka nwanyị e kpuchiri ihu 
nʼetiti igwe anụ ụlọ ndị enyi gị. 
Ndị Enyi 
 8 Ọ bụrụ na ị maghị, gị nwanyị kachasị mma, 
soro nzọ ụkwụ igwe atụrụ 
meekwa ka ụmụ ewu gị taa ahịhịa 
dị nʼakụkụ ụlọ ikwu ndị na-elekọta atụrụ. 
Onye hụrụ ibe ya nʼanya 
 9 Ana m atụnyere gị, gị onye m hụrụ nʼanya dịka nne ịnyịnya 
e kenyere nʼotu ụgbọ agha Fero. 
 10 Agba nti gị ka e jiri ọlantị chọọ mma, 
olu gị kwa ka e jiri nkume dị oke ọnụahịa e doro nʼahịrị chọọ mma. 
 11 Anyị ga-emere gị ọlantị dị iche iche nke ọlaedo, 
nke e ji ọlaọcha chọọ mma. 
Onye a hụrụ nʼanya 
 12 Mgbe eze nọ na tebul ya, 
mmanụ isi ọma m tere sijuru ebe niile. 
 13 Onye m hụrụ dị m ka ụda máᆠ1:13 Ụda máá bụ eso e ji eme ihe otite na-esi isi ụtọ. A na-ewepụta eso ndị a nʼosisi Balsam nke na-eto nʼobodo Kush, nʼetiti ọwụwa anyanwụ nakwa India. e kechiri nʼakpa 
nke dị nʼetiti ara m abụọ. 
 14 Onye m hụrụ nʼanya dịrị m ka ụyọkọ ukwu okoko henna‡ 1:14 Okoko osisi henna bụ ahịhịa isi ọma a na-eji emepụta senti. 
nke sitere nʼogige ubi vaịnị En-Gedi.§ 1:14 Bụ odo mmiri dị nʼọdịda osimiri nwụrụ anwụ. Ọtụtụ osisi nke a na-esi na ha enweta eso na-esi isi ọma, jupụtara nʼebe ahụ. 
Onye hụrụ ibe ya nʼanya 
 15 Nʼezie, ị mara mma, onye m hụrụ nʼanya. 
Leenụ ka ị si maa mma! 
Anya gị dịka nduru. 
Onye a hụrụ nʼanya 
 16 Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma nwoke. 
E, ị mara mma. 
Ebe ndina anyị dịka ahịhịa ndụ. 
Onye hụrụ ibe ya nʼanya 
 17 Ogidi nke ụlọ anyị bụ osisi sida, 
ntuhie ya bụkwa osisi fịa. 
*1:5 1:5 Ndị Keda bụ otu ebo nʼetiti ndị Arab, obodo ha dị na ndịda ọdịda anyanwụ Edọm. Ha na-ebi nʼụlọ ikwu e ji ajị ewu ojii wuo
†1:13 1:13 Ụda máá bụ eso e ji eme ihe otite na-esi isi ụtọ. A na-ewepụta eso ndị a nʼosisi Balsam nke na-eto nʼobodo Kush, nʼetiti ọwụwa anyanwụ nakwa India.
‡1:14 1:14 Okoko osisi henna bụ ahịhịa isi ọma a na-eji emepụta senti.
§1:14 1:14 Bụ odo mmiri dị nʼọdịda osimiri nwụrụ anwụ. Ọtụtụ osisi nke a na-esi na ha enweta eso na-esi isi ọma, jupụtara nʼebe ahụ.