Abụ Ọma  
Nchịkọta Akwụkwọ nke mbụ 
 1
Abụ Ọma 1–41 
Onye ihe na-agara nke ọma 
 1 Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ, 
onye na-adịghị aga ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu; 
onye na-adịghị eguzokwa nʼụzọ ndị mmehie 
maọbụ soro nʼotu ndị nkwutọ. 
 2 Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị. 
Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị, 
 3 Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, 
nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya, 
nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ. 
Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma. 
 4 Ma ndị ajọ omume adịghị otu a. 
Ha dị ka igbugbo ọka 
nke oke ifufe na-efesasị. 
 5 Ya mere, ndị ajọ omume agaghị eguzosi ike nʼụbọchị ikpe; 
ndị mmehie agaghị eguzokwa na nzukọ ndị ezi omume. 
 6 Nʼihi na Onyenwe anyị na-eche ụzọ ndị ezi omume nche. 
Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-eduba ha nʼịla nʼiyi.