Habakuk  
 1
 1 Nke a bụ ozi Habakuk onye amụma natara. 
Mkpesa Habakuk 
 2  Onyenwe anyị, ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-eti mkpu 
ma ị dịghị ege ntị? 
Ruo ole mgbe ka m ga na-etiku gị na-asị, “Ihe ike, ihe ike!” 
ma ị dịghị azọpụta? 
 3 Nʼihi gịnị ka i ji eme m ka m na-ahụ ihe ọjọọ? 
Gịnị mere i ji anagide mmegbu? 
Mbibi na ihe ike dị nʼihu m, 
na ịlụ ọgụ, na esemokwu jupụtakwara ebe niile. 
 4 Nʼihi ya, iwu na-ada mba, 
ikpe ziri ezi adịghị agakwa nʼihu. 
Ndị ajọ mmadụ na-agba ndị ezi omume gburugburu, 
nke mere ka ikpe ziri ezi ghọọ ihe gbagọrọ agbagọ. 
Ọsịsa Onyenwe anyị 
 5 “Legide mba niile anya, ka i hụ. 
Lee, ka o ju gị anya nke ukwuu. 
Nʼihi na agaje m ime ihe nʼụbọchị ndụ unu, 
nke unu na-agaghị ekwenye, 
ọ bụladị ma akọọrọ unu ya. 
 6 Nʼihi na lee, agaje m ime ka ndị Kaldịa bilie, 
bụ mba ahụ na-adịghị eme ebere, na ndị na-eme ngwangwa. 
Ha bụ ndị na-ebu agha na-ejegharị na mba niile, 
ndị na-esite nʼaka ike na-enweta ebe obibi nke na-abụghị nke ha. 
 7 Ha bụ mba a na-atụ ụjọ, na ndị dịkwa egwu. 
Ha bụ iwu nye onwe ha, ihe ha tụpụtara ka ha na-eme. 
Ọ bụ onwe ha ka ha na-ebuli elu. 
 8 Ịnyịnya ha nwere ụkwụ nkọ karịa agụ. 
Ha na-akpa ike karịa nkịta ọhịa nke na-ejegharị nʼanyasị. 
Ndị ịnyịnya agha ha na-awụ ọsọ, 
ndị ha na-agba ịnyịnya na-esitekwa ebe dị anya na-abịa. 
Dịka ugo nke na-efedata i buru nri ọ ga-eri. 
 9 Ha niile na-abịa ime ihe ike. 
Ha ji ọsọ na-abịa dịka oke ifufe nke ọzara. 
Ha na-abịa ịchịkọta ndị a dọtara nʼagha dịka ha bụ uzuzu. 
 10 Ha na-akwa ndị eze emo, 
jirikwa ndịisi ọchịchị na-eme ihe ọchị. 
Ha na-achị ebe niile e wusiri ike ọchị, 
na-ekpokọtakwa aja nʼazụ mgbidi niile ịlụta ha nʼagha. 
 11 Mgbe ahụ, ha na-esi nʼebe ahụ gabiga dịka ifufe, na-agabigakwa 
ndị mehierenụ, bụrụkwa ndị ikpe mara, ndị ike ha bụ chi ha.” 
Mkpesa Habakuk nke ugboro abụọ 
 12  Onyenwe anyị, Ọ bụ na ị dịghị site mgbe niile ebighị ebi? 
Chineke m, na Onye Nsọ m, Ị gaghị anwụ. 
Gị, Onyenwe anyị, họpụtara ha maka ikpe ikpe. 
Gị, oke nkume m, emeela ka ha bụrụ ndị ga-enweta ahụhụ. 
 13 Ma anya gị dị ọcha nke ukwuu, na ọ dịghị elekwasị ajọ ihe anya; 
ị naghị anabatakwa mmegbu. 
Ma gịnị mere i ji gba ndị aghụghọ nkịtị? 
Gịnị mere i ji gba nkịtị mgbe ndị ajọ omume na-eloda 
ndị bụ ndị ezi omume karịa ha? 
 14 I meela ndị mmadụ ka ha dịrị ka azụ nke osimiri, 
e, dịka anụ na-akpụ akpụ nke oke osimiri, nke na-enweghị onye na-achị ha. 
 15 Onye iro nke ajọ omume juru obi, na-eji nko ya na-egbu ha. 
Ọ na-ejikwa nko ụgbụ ya na-ejide ha. 
Ọ na-achịkọta ha nʼụgbụ ya, 
si otu a na-aṅụrị ọṅụ, ma na-etegharịkwa egwu ọṅụ. 
 16 Nʼihi nke a, ọ na-achụ aja 
na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ụgbụ ya, 
nʼihi na ọ bụ ụgbụ ya na-eme ka ọ na-ebi ezi ndụ, 
na-erikwa nri kachasị mma 
 17 Ọ ga-aga nʼihu mgbe niile na-awụpụ ihe o ji ụgbụ ya gbute 
na-ala mba niile nʼiyi, dịka o si masị ya, na-egosighị obi ebere ọbụla?