5
 1 “Kpọọ oku ma ị chọọ, ma onyekwanụ ga-aza gị? 
Ole ndị dị nsọ ị ga-agbakwuru? 
 2 Oke iwe na-egbu onye nzuzu, 
ekworo na-egbu onye na-enweghị uche. 
 3 Mụ onwe m ahụla onye nzuzu ka ọ na-agba mgbọrọgwụ, 
mana mberede, abụrụ ụlọ ya ọnụ. 
 4 Ụmụ ya na-anọpụ anya site nʼebe nchebe dị, 
a na-azọpịa ha nʼọnụ ụzọ ama, ọ dịkwaghị onye na-anapụta ha. 
 5 Onye agụụ na-agụ na-eripịa ihe o wetara nʼubi; 
ọ na-ewere ihe ubi ndị a ọ bụladị site nʼetiti ogwu; 
akụnụba ya ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ga-achụso. 
 6 Nʼihi na ọnọdụ ọjọọ adịghị esite nʼala pupụta, 
ma ọ bụkwanụ nsogbu adịghịkwa esite nʼala walite. 
 7 Kama, a mụrụ mmadụ nye nsogbu,* 5:7  14:1 
dịka ire ọkụ si esite nʼọkụ a kwanyere na-amali elu. 
 8 “Ma ọ bụrụ na m bụ gị, m ga-ekpesara Chineke; 
ya ka m ga-akọsara ihe niile. 
 9 Nʼihi na Chineke na-arụ ọrụ ịtụnanya karịrị nghọta, 
ọrụ ebube nke a na-apụghị ịgụta ọnụ. 
 10 Ọ bụ ya na-enye elu ụwa mmiri ozuzo, 
ma na-ezigakwa mmiri nʼubi niile. 
 11 Ọ na-ebuli ndị dị ala elu, 
na-emekwa ka ndị na-eru ụjụ nọ nʼebe a na-echebe ha. 
 12 Ọ na-emebi nzube niile nke ndị aghụghọ, 
ka aka ha ghara imezu ihe ha zubere. 
 13 Ọ na-ejide ndị oke amamihe nʼaghụghọ ha niile, 
mee ka atụmatụ ndị aghụghọ bụrụ ihe e kpochapụrụ. 
 14 Ọchịchịrị na-abịakwasị ha nʼoge ehihie, 
nʼetiti ehihie ha na-asọ ìsì dịka ndị nọ nʼọchịchịrị nke abalị; 
 15 Ọ na-azọpụta ndị mkpa na-akpa, site na mma agha dị ha nʼọnụ, 
ọ na-anapụtakwa ha site nʼaka ndị dị ike. 
 16 Ya mere, ndị ogbenye na-enwe olileanya, 
ikpe ezighị ezi na-emechikwa ọnụ ya. 
 17 “Ngọzị na-adịrị mmadụ ahụ Chineke na-adọ aka na ntị; 
ya mere, ajụla ịdọ aka na ntị nke Onye pụrụ ime ihe niile. 
 18 Nʼihi na ọ na-etihịa mmadụ ahụ ma na-ekechikwa ọnya ha; 
Ọ na-eti mmadụ ihe, ma aka ya na-agwọkwa. 
 19 Ọ ga-anapụta gị site nʼụzọ nsogbu isii, 
mee ka ihe ọjọọ hapụ irute gị na nsogbu nke asaa. 
 20 Ọ ga-echebe gị ka ị hapụ ịnwụ nʼoge ụnwụ; 
chebekwa gị ka mma agha hapụ ịmetụ gị nʼoge agha. 
 21 Ị ga-abụ onye a na-echebe site na nkwutọ nke ire ndị ga-ekwutọ gị. 
Ị gaghị atụkwa egwu mgbe mbibi bịara. 
 22 Ị ga-achị ọchị nʼoge ụnwụ na nʼoge mbibi, 
ị gaghị atụkwa egwu ajọ anụ ọhịa dị iche iche. 
 23 Nʼihi na gị na nkume niile dị nʼọhịa ga-agba ndụ, 
gị na anụ ọhịa ga-anọkwa nʼudo. 
 24 Ị ga-amata na ụlọ ikwu gị dị nʼudo; 
ị ga-agụkọ ihe niile i nwere chọpụta na o nweghị nke na-efu efu. 
 25 Ị ga-amata na ụmụ gị ga-adị ọtụtụ, 
matakwa na ụmụ ụmụ gị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka ahịhịa dị nʼala. 
 26 Ị ga-aba nʼili gị mgbe i mere nnọọ ezigbo agadi, 
dịka ọka a ghọrọ mgbe oge ya ruru. 
 27 “Anyị enyochaala ihe a, hụ na ọ bụ eziokwu. 
Ya mere nụrụ ya, ma jiri ya rụọ ọrụ na ndụ gị.”