4
Okwu Onyenwe anyị megide Izrel 
 1 Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Izrel, 
nʼihi na Onyenwe anyị nwere ebubo* 4:1 Maọbụ, Onyenwe anyị akpọọla unu ikpe 
megide unu ndị bi nʼala a. 
“Nʼihi na ọ dịghị ikwesi ntụkwasị obi, ọ dịghị ịhụnanya, 
ọ dịghịkwa ihe ọmụma banyere Chineke nʼala a niile.† 4:1 Ịma ihe banyere Chineke adịghị nʼuche unu 
 2 Ọ bụ naanị ịbụ ọnụ,‡ 4:2 Maọbụ, ịṅụ iyi ịgha ụgha na igbu mmadụ, 
izu ohi na ịkwa iko. 
Ọgbaaghara dị nʼebe niile, 
ya na ogbugbu mmadụ na-esepụghị aka. 
 3 Nke a mere ala jiri nọrọ nʼiru ụjụ, 
ndị niile nọ na ya na-atakwa ahụ,§ 4:3 Maọbụ, na-anwụkwa anwụ 
ma anụ ọhịa, ma nnụnụ nke igwe, 
ọ bụladị azụ dị nʼosimiri ka a na-ekpochapụ. 
 4 “Ma otu ọ dị, ka onye ọbụla ghara ise okwu, 
ka onye ọbụla ghara ibo ibe ya ebubo. 
Nʼihi na ndị gị dịka 
ndị na-eseso onye nchụaja okwu. 
 5 Ị na-asọ ngọngọ ehihie na abalị, 
ndị amụma na-esokwa gị sụọ ngọngọ. 
Nʼihi ya aga m ala nne gị nʼiyi 
 6 ndị m ka a na-ala nʼiyi nʼihi na ha amaghị ihe. 
“Ebe ọ bụ na ị jụrụ ihe ọmụma, 
aga m ajụkwa gị dị ka onye nchụaja m; 
ebe ọ bụ na ị gbakụtara iwu Chineke gị azụ 
mụ onwe m ga-agbakụtakwa ụmụ gị azụ. 
 7 Ka ha* 4:7 Ya bụ, ndị nchụaja na-abawanye nʼọnụọgụgụ, 
otu a ka ha si na-aga nʼihu na-emehie megide m, 
ha gbanwere Chineke ha dị ebube nʼihi ihe na-eweta ihere.† 4:7 Akwụkwọ Masori na-ede, nsọpụrụ ha ka m gbanwere ka ọ ghọọ ihere 
 8 Ha na-eriju afọ site na mmehie ndị m. 
Ha ji anya ukwu na-achọ ka ha na-emehie na-aga nʼihu. 
 9 Ọ ga-abụkwa ka ndị nchụaja dị, otu a ka ndị obodo dịkwa. 
Nʼihi ya, aga m enye ha ntaramahụhụ 
ma kwụghachi ha ụgwọ nʼihi omume ha niile. 
 10 “Ha ga na-eri ihe ma afọ agaghị eju ha. 
Ha ga-ebi ndụ akwụna ma ha agaghị amụba, 
nʼihi na ha ajụla Onyenwe anyị, 
were onwe ha nyefee  11 nʼaka ịgba akwụna, 
na mmanya ochie na mmanya ọhụrụ, 
nke na-ewepụ mmụọ nghọta. 
 12 Ndị nke m na-ajụ osisi apịrị apị ase ihe ha ga-eme, 
na-anata ọsịsa site na mkpara osisi onye ọ na-ajụ ase. 
Mmụọ nke ịgba akwụna na-eme ka ha kpafuo; 
ha gbara akwụna ma hapụ Chineke ha. 
 13 Ha na-achụ aja nʼelu ugwu niile, 
na-esure onyinye nsure ọkụ nʼelu ugwu nta niile, 
na nʼokpuru osisi ook, osisi pọpla na osisi terebint, 
ebe ndo ya dị ezi mma. 
Nʼihi nke a ka ụmụ unu ndị inyom na-agba akwụna, 
ndị nwunye ụmụ unu na-akwa iko. 
 14 “Agaghị m ata ụmụ unu ndị inyom ahụhụ, 
mgbe ha na-agba akwụna, 
maọbụ taa ndị nwunye ụmụ nwoke unu ahụhụ 
mgbe ha na-akwa iko, 
nʼihi na ndị ikom unu nʼonwe ha na-ejekwuru ndị akwụna, 
ha na ndị akwụna ụlọ arụsị na-achụkọkwa aja, 
ma ndị a na-enweghị nghọta ga-ala nʼiyi. 
 15 “Ọ bụ ezie na unu bụ ndị na-akwa iko unu bụ Izrel, 
ma ka ikpe gharakwa ịma Juda. 
“Unu agakwala Gilgal, 
unu agakwala ruo Bet-Aven, 
unu aṅụkwala iyi sị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ.’ 
 16 Ndị Izrel dị isiike 
dịka nwaagbọghọ ehi dị isiike. 
Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa zụọ ha 
dịka ụmụ atụrụ nʼebe ịta nri sara mbara? 
 17 Ifrem na arụsị agbaala ndụ 
hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya. 
 18 Ọ bụladị mgbe mmanya ha gwụrụ, 
ha na-aga nʼihu na-agba akwụna; 
ha hụrụ ihere nʼanya nke ukwuu karịa otuto ha. 
 19 Ifufe ga-ebupụ ha, 
aja ha na-achụ ga-ewetara ha ihere.