Abụ Ọma 31
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. 
Oge m dị gị nʼaka 
 1  Onyenwe anyị, nʼime gị, ka m gbabara izere ndụ; 
ekwela ka ihere* 31:1 Ihere Maọbụ, ihe na-eweta ọnụma ma ọ bụkwanụ, ọnọdụ ịkwa emo mee m; 
site nʼezi omume gị gbapụta m. 
 2 Tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m, 
bịa ngwangwa gbapụta m; 
ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, 
ebe mgbaba e wusiri ike maka nzọpụta m. 
 3 Ebe ị bụ oke nkume m na ebe mgbaba m e wusiri ike, 
nʼihi aha gị, duo m ma na-edukwa m. 
 4 Napụta m site nʼọnya nke e zobere nʼihi m, 
nʼihi na ọ bụ naanị gị bụ ebe mgbaba m siri ike. 
 5 Nʼaka gị ka m na-enyefe mmụọ m; 
gbapụta m, o Onyenwe anyị, Chineke, onye eziokwu. 
 6 Akpọrọ m ha asị bụ ndị niile na-efe chi mba ọzọ ndị na-abaghị uru; 
ana m atụkwasị Onyenwe anyị obi m. 
 7 Aga m enwe obi ụtọ ma ṅụrịkwaa ọṅụ nʼime ịhụnanya gị, 
nʼihi na ị hụrụ nsogbu m 
marakwa ihe mgbu nke mmụọ m. 
 8 I wereghị m nyefee nʼaka ndị iro m, 
kama i nyela m ohere ijegharị ebe ọbụla m chọrọ. 
 9 O Onyenwe anyị, meere m amara nʼọnọdụ ihe mgbu m. 
Anya m abụọ na-acha uhie uhie nʼihi ịkwa akwa; 
ike adịghịkwa m. 
 10 Iru ụjụ eriela m ahụ; 
ịkwa akwa m ewepụla ihe nʼafọ m; 
ihe mgbu m mere ka ike gwụsịa m 
ruo na ume adịghịkwa nʼọkpụkpụ m. 
 11 Nʼihi ndị iro m niile; 
ndị agbataobi m na-elelị m anya. 
Ndị enyi m na-atụ ụjọ ịbịakwute m, 
ndị hụrụ m nʼokporoụzọ na-esite ụzọ ọzọ gafee. 
 12 Aghọọla m onye e chefuru echefu, dị ka a ga-asị na m nwụrụ anwụ. 
A pụrụ iji ite kụwara akwụwa tụnyere m. 
 13 Anụla m nkwulu ha megide m; 
oke egwu dị nʼakụkụ niile; 
ha na-agba izu megide m, 
na-agba izu nzuzo iji napụ m ndụ m. 
 14 Ma ana m atụkwasị gị obi Onyenwe anyị. 
Ekwuola m ya sị, “Naanị gị bụ Chineke m.” 
 15 Oge m niile dị gị nʼaka. 
Napụta m nʼaka ndị iro m 
na nʼaka ndị ahụ na-adịghị ezu ike ịchụ m ọsọ. 
 16 Mee ka amara gị mụkwasị ohu gị dịka anyanwụ; 
zọpụta m nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ. 
 17 O Onyenwe anyị, ekwela ka ihere mee m, 
nʼihi na akpọkuola m gị; 
kama mee ka ihere mee ndị na-eme ihe ọjọọ, 
ka ha tọgbọrọ nʼala mmụọ debe ọnụ ha duu. 
 18 Ka ọnụ ahụ ha ji ekwu okwu ụgha mechie kpamkpam; 
nʼihi na ọ bụ site na mpako na nlelị 
ka ha ji na-ekwu okwu megide ndị ezi omume. 
 19 Lee ka ịdị mma gị si baa ụba, 
nke i na-edebere ndị niile na-atụ egwu gị, 
nke ị na-enye ndị na-agbaba nʼime gị, 
nʼihu ọha mmadụ. 
 20 I na-ezobe ha nʼebe nzuzo gị 
pụọ nʼizu nzuzo nke ụmụ mmadụ; 
ị na-echebe ha nʼime ebe obibi gị; 
ka ha pụọ nʼebubo nke ire dị iche iche. 
 21 Otuto dịrị Onyenwe anyị 
nʼihi na o gosila m ịhụnanya ya dị ukwuu 
mgbe m nọ nʼobodo ndị iro gbara gburugburu. 
 22 Akụjara m, kwuo okwu nʼụjọ sị, 
“Ewezugala m site nʼihu ya!” 
Ma ị nụrụ arịrịọ m maka ebere 
mgbe m kpọkuru gị ka i nyere m aka. 
 23 Hụnụ Onyenwe anyị nʼanya, unu ndị ya niile kwesiri ntụkwasị obi, 
nʼihi na Onyenwe anyị na-anapụta ndị niile kwesiri ntụkwasị obi nye ya, 
ma ọ na-akwụghachi ndị mpako oke zuru ezu. 
 24 Ya mere, dịrịnụ ike, ka obi siekwa unu ike, 
unu niile ndị olileanya ha dị nʼime Onyenwe anyị.