34
Ọnwụ Mosis 
 1 Mgbe ahụ, Mosis sitere na mbara ala Moab rigoruo nʼelu nʼugwu Nebo, ruo nʼelu Pisga, nke dị na ncherita ihu Jeriko. Nʼebe ahụ Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ala ahụ niile anya site na Gilead ruo Dan;  2 ya na ala Naftalị niile nʼoke ala Ifrem, na nke Manase, na ala Juda niile ruo nʼosimiri Mediterenịa.* 34:2 Osimiri Mediterenịa dị nʼọdịda anyanwụ  3 Mosis hụkwara ala Negev, na akụkụ ala ahụ niile dị site na Ndagwurugwu Jeriko, obodo nkwụ, ruo Zoa.  4 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Nke a bụ ala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee Ebraham, Aịzik na Jekọb nkwa mgbe m kwuru sị, ‘Aga m enye ya ụmụ ụmụ gị.’† 34:4  Jen 12:7 Ugbu a emeela m ka i jiri anya gị hụ ya ma ị gaghị agabiga banye nʼime ya.”‡ 34:4  Dit 3:27 
 5 Ya mere, Mosis, onyeozi Onyenwe anyị nwụrụ nʼebe ahụ, nʼala Moab, dịka Onyenwe anyị kwuru.  6  Onyenwe anyị liri ya na Moab, na ndagwurugwu chere ihu na Bet-Peoa, ma ruo taa, ọ dịghị onye ọbụla maara ebe ili ya dị.  7 Mosis gbara narị afọ na iri afọ abụọ mgbe ọ nwụrụ, ma nʼoge ahụ ike ka dị ya nʼahụ, anya ya na-ahụkwa ụzọ nke ọma.  8 Ụmụ Izrel ruru ụjụ nʼihi Mosis, iri ụbọchị atọ nʼobosara ala Moab, tutu ruo mgbe oge iru ụjụ na ịkwa akwa gasịrị. 
 9 Joshua nwa Nun, jupụtara na mmụọ amamihe,§ 34:9  Aịz 11:2 nʼihi na Mosis ebikwasịla ya aka nʼisi. Ya mere, ụmụ Izrel ṅara Joshua ntị, gbasookwa iwu niile Onyenwe anyị nyere ha site nʼọnụ Mosis. 
 10 Ọ dịbeghị onye amụma ọzọ pụtarala nʼala Izrel niile, nke dịka Mosis,* 34:10  Dit 18:15,18 onye ya na Onyenwe anyị kparịtara ụka ihu na ihu,† 34:10  Ọpụ 33:11; Ọnụ 12:8; Dit 5:4  11 onye mere ihe ịrịbama ndị a niile, rụọkwa ọrụ ebube niile nke Onyenwe anyị ziri ya ka o mee nʼIjipt, nʼihu Fero, na ndị ozi ya niile, nakwa nʼala ahụ niile.  12 Nʼihi na o nwebekwaghị onye ọzọ gosirila ike dị oke egwu, maọbụ rụọ ọrụ dị oke egwu ụdị nke Mosis rụrụ nʼihu ndị Izrel niile.