12
Ọnụọgụgụ ndị eze e meriri 
 1 Ndị a bụ ndị eze ala ndị ahụ ndị Izrel lara nʼiyi, bụ ala ndị ahụ ha nwetara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Obodo niile a lara nʼiyi bụ ndị dị site na ndagwurugwu iyi Anọn ruo nʼugwu Hemon ha na akụkụ ọwụwa anyanwụ Araba. 
 2 Saịhọn, eze ndị Amọrait, onye bi na Heshbọn. 
Ala ya gbatịrị site nʼAroea, nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn, na nʼetiti ndagwurugwu iyi Anọn, ruo iyi Jabọk, nke bụ oke ala ụmụ Amọn. Ọkara ala Gilead, nke dị nʼugwu iyi Jabọk bụkwa ala ya. 
 3 Ọ bụkwa Saịhọn na-achị akụkụ ọwụwa anyanwụ Araba site nʼosimiri Kineret ruo nʼosimiri Araba (ya bụ, Osimiri Nnu), ruo Bet-Jeshimọt, gbadaakwa akụkụ ndịda ndịda ruo na mgbada ugwu Pisga. 
 4 Ha merikwara Ọg, eze Bashan, onye bụ otu nʼime ndị eze ikpeazụ ndị agbụrụ Refaim. Isi alaeze ya dị nʼAshtarọt na Edrei. 
 5 Ọ chịrị nʼugwu Hemon, Saleka, ala Bashan niile ruo nʼoke ha na ndị Geshua na Maaka nwere, nakwa ọkara nke Gilead, bụ oke ala Saịhọn, bụ eze Heshbọn. 
 6 Ọ bụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị, na ụmụ Izrel, lara eze abụọ ndị a nʼiyi. Mosis nyekwara ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase ala ha. 
 7 Ndị a bụ aha ndị eze niile Joshua na ụmụ Izrel meriri, nʼofe osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, site na Baal-Gad nke dị na ndagwurugwu Lebanọn, ruo nʼugwu Halak nke dị na mgbago nʼụzọ Sia. Joshua nyere ebo Izrel niile ala ha ndị a dịka ihe nketa, nʼusoro dịka ebo ha si dị.  8 Ala ndị ọzọ bụkwa ala ugwu ugwu ahụ, na ala dị na mgbada ugwu ọdịda anyanwụ, na ala Araba, na ala ndị dị na mgbada ugwu, na ọzara, nakwa Negev. Ndị a bụ ala ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Kenan, ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus. 
Ndị a bụ ndị eze ahụ: 
 9 Eze Jeriko, otu 
eze Ai (nke dị nso na Betel), otu 
 10 eze Jerusalem, otu 
eze Hebrọn, otu 
 11 Eze Jamut, otu 
eze Lakish, otu 
 12 eze Eglọn, otu 
eze Gaza, otu 
 13 eze Debịa, otu 
eze Geda, otu 
 14 eze Homa, otu 
eze Arad, otu 
 15 eze Libna, otu 
eze Adulam, otu 
 16 eze Makeda, otu 
eze Betel, otu 
 17 eze Tapụọa, otu 
eze Hefa, otu 
 18 eze Afek, otu 
eze Lasharọn, otu 
 19 eze Madọn, otu 
eze Hazọ, otu 
 20 eze Shịmrọn Meron, otu 
eze Akshaf, otu 
 21 eze Teanak, otu 
eze Megido, otu 
 22 eze Kedesh, otu 
eze Jokneam, nʼime Kamel, otu 
 23 eze Doa, (nʼime obodo Naftod), otu 
eze Goiim, nʼime Gilgal,* 12:23 Ka o doo anyị anya nʼobodo Gilgal nke a, abụghị otu ihe ya na nke dị nso nʼobodo Jeriko. otu 
na  24 eze Tịaza, otu. 
Ha niile dị ndị eze iri atọ na otu. 
*12:23 12:23 Ka o doo anyị anya nʼobodo Gilgal nke a, abụghị otu ihe ya na nke dị nso nʼobodo Jeriko.