24
 1 Nʼoge a, Belam aghọtala nʼuche ya na ọ masịrị Onyenwe anyị ịgọzi Izrel. Ya mere, ọ họrọghị ịgba afa dịka o mere nʼoge ndị gara aga, kama o chere ihu ya nʼọzara.  2 Mgbe Belam lepụrụ anya ọ hụrụ ụmụ Izrel dịka ha si maa ụlọ ikwu nʼebo nʼebo. Mgbe ahụ kwa, Mmụọ nke Chineke dakwasịrị ya.  3 O buru amụma ndị a sị, 
“Okwu si nʼọnụ Belam nwa Beoa pụta, 
okwu onye ahụ anya ya saghere asaghe. 
 4 Okwu onye ahụ na-anụ okwu Chineke 
onye na-ahụ ọhụ site nʼaka onye pụrụ ime ihe niile. 
Onye na-ada nʼala ma anya ya na-eghe oghe. 
 5 “Lee ka ebe obibi gị si maa mma, gị Jekọb, 
ebe obibi gị niile, gị Izrel! 
 6 “Dịka ndagwurugwu dị iche iche ka ha gbasapụrụ, 
dịka ubi a gbara ogige dị nʼakụkụ osimiri, 
dịka osisi aloos nke Onyenwe anyị kụrụ, 
dịka osisi sida dị nʼakụkụ mmiri. 
 7 Mmiri ga-esi nʼite mmiri ha na-erupụta, 
mkpụrụ ha ga-enwekwa mmiri dị ukwuu. 
“Eze ha ga-adị ukwuu karịa Agag, 
a ga-ebulikwa alaeze ha elu. 
 8 “Chineke sitere nʼala Ijipt kpọpụta ha. 
Ha nwere ike dịka atụ. 
Ha ga-eripịa mba niile na-ebili imegide ha. 
Ha ga-anyajisi ọkpụkpụ ha niile, 
jirikwa ọtụtụ àkụ ha gbatuo ha. 
 9 Ha na-amakpuru, dinara ala dịka ọdụm, 
dịka nne ọdụm, onye pụrụ ịkpọte ha? 
“Ngọzị na-adịrị onye ọ bụla na-agọzi gị, 
ma ọbụbụ ọnụ na-adịrị onye ọbụla na-akọcha gị.” 
 10 Iwe Balak dị ọkụ megide Belam nʼoge a. Ọ kụkọtara aka ya abụọ nʼiwe. Tie mkpu sị Belam, “Akpọrọ m gị ka ị bịa bụọrọ m ndị iro m ọnụ. Ma ị gọziela ha ugboro atọ a.  11 Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị! Laghachi nʼụlọ gị! Akwadobere m inye gị ọnọdụ dị elu, ma Onyenwe anyị e gbochiela gị inweta ụgwọ ọrụ a.” 
 12 Belam zara Balak sị, “Ọ bụ na m agwaghị ndị ozi gị niile, bụ ndị ị zitere m,  13 ‘na a sịkwarịị na Balak enye m ọlaọcha na ọlaedo niile nke dị nʼụlọeze ya, apụghị m ime ihe ọbụla nʼike aka, maọbụ ihe ọma maọbụ ihe ọjọọ, ị gabiga iwu Onyenwe anyị. Ọ bụkwa naanị ihe Onyenwe anyị na-ekwu ka m ga-ekwu’?  14 Ugbu a, ana m alakwuru ndị m, ma bịa, ka m dọọ gị aka na ntị banyere ihe ndị a ga-eme ndị gị nʼụbọchị ndị a na-abịa nʼihu.” 
Amụma Belam nke anọ 
 15 Ya mere Belam kwuru okwu ndị a: 
“Amụma Belam nwa Beoa, 
amụma nke onye ahụ anya ya nʼahụ ụzọ nke ọma, 
 16 amụma onye ahụ nke na-anụ okwu Chineke, 
onye ihe ọmụma ya si nʼebe Onye kachasị ihe niile elu na-abịa. 
Onye na-ahụ ọhụ site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile. 
Onye na-ada nʼala, ma anya ya abụọ ghekwa oghe. 
 17 “Ana m ahụ ya, ma ọ bụghị ugbu a, 
ana m ele ya anya, ma ọ nọghị nso. 
Otu kpakpando ga-esi nʼime Jekọb zolie. 
Mkpara eze ga-esi nʼetiti Izrel bilie. 
Ọ ga-etipịa egedege ihu ndị Moab, 
na okpokoro isi ndị ikom Shet niile. 
 18 A ga-emeri Edọm,* 24:18 Ndị Edọm si nʼagbụrụ Ịsọ. Jen 36:1-9 
Sia, onye iro ya, ka a ga-emeri nʼagha. 
Ma Izrel ga-eto, ghọọ onye dị ike. 
 19 Otu onye ọchịchị ga-esi na Jekọb pụta. 
Bibie ndị niile fọdụrụ nʼobodo ahụ.” 
Amụma Belam nke ise 
 20 Mgbe ahụ, Belam lepụrụ anya legide ụlọ ndị Amalek niile, buo amụma banyere ha sị: 
“Amalek bụ mba mbụ nʼetiti mba niile, 
ma ikpeazụ ya bụ mbibi!” 
Amụma Belam nke isii 
 21 Ọ hụrụ ndị Ken anya, kwuo okwu ya: 
“E, i bi ugbu a nʼebe e wusiri ike,† 24:21 Ya bụ nke nʼadịgide adịgide 
akwụ gị dị nʼime oke nkume ahụ! 
 22 Ma, a ga-ebibi unu ndị Ken niile, 
mgbe Ashọ ga-adọta unu nʼagha.” 
Amụma Belam nke asaa 
 23 Ndị a bụ okwu o ji mechie amụma ya: 
“Onye ga-adị ndụ mgbe Chineke ga-eme ihe ndị a? 
 24 Ụgbọ mmiri ga-esi nʼọnụ mmiri Saiprọs bịa. 
Ha ga-eji ike dobe ndị Eba‡ 24:24 Eba bụ nna nna ndị Hibru. Jen 10:21; 1Ih 1:25-27 na ndị Ashọ nʼokpuru ha, 
ma a ga-ebibikwa ha onwe ha.” 
 25 Emesịa, Belam biliri laghachi nʼụlọ ya, ma Balak gbasoro ụzọ nke ya.