9
Okwu Job 
 1 Job zara sị: 
 2 “Nʼezie, amaara m na ihe ndị a bụ eziokwu. 
Ma mmadụ dị ndụ ọ ga-esi aṅaa gosi na ya bụ onye aka ya dị ọcha nʼihu Chineke? 
 3 Ọ bụrụ na Chineke ekpebie ịjụ mmadụ ajụjụ, 
ebee ka mmadụ ahụ nọ nke nwere ike ịza ọ bụladị otu nʼime ajụjụ dị iche iche Chineke ga-ajụ ya? 
 4 Amamihe ya dị ukwuu, ike ya sara mbara, 
onye guzogidere ya ma hapụ imerụ ahụ? 
 5 Ọ na-enugharị ugwu ukwu ma ha adịghị ama nke a, 
na-akwatụ ha nʼiwe ya. 
 6 Ọ na-enugharịkwa ụwa site na ntọala ya, 
mee ka ogidi ya maa jijiji. 
 7 Ọ na-agwa anyanwụ okwu mee ka ọ kwụsị ịcha; 
ọ na-emenyụ ìhè kpakpando na-enye. 
 8 Naanị ya gbasara mbara eluigwe, 
ọ na-agakwa ije nʼelu ebili mmiri nke oke osimiri. 
 9 Ọ bụ ya mere kpakpando Bịaa, na Orion 
na Pleiades, na kpakpando niile nke ndịda eluigwe. 
 10 Ọ na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube nke mmadụ na-enweghị ike ịghọta, 
ihe ịrịbama nke ọnụ na-enweghị ike ịgụta. 
 11 Mgbe ọ na-esi nʼakụkụ m agafe, enweghị m ike ịhụ ya, 
mgbe ọ na-agabiga, adịghị m amata na ọ bụ ya. 
 12 Ọ bụrụ na ọ pụnara ihe, onye na-akwụsị ya? 
Onye kwa pụrụ ịjụ ya si, ‘Gịnị ka ị na-eme?’ 
 13 Chineke adịghị eme ka iwe ya laghachi, 
ọbụladị ndị inyeaka Rehab, ruru ala nʼụkwụ ya. 
 14 “Onye kwanụ ka m bụ, m ga-eji nwee ike iguzo nʼihu ya ịjụ ya ajụjụ, 
maọbụ mụ na ya ịrụrịta ụka? 
 15 Nʼagbanyeghị na aka m dị ọcha, apụghị m ịsa ya okwu; 
kama m ga-arịọ onye ikpe m ka o mere m ebere. 
 16 A sịkwarị na m kpọọ ya oku, ọ za m, 
ekwenyeghị m na ọ ga-ege m ntị. 
 17 Ọ ga-eji oke ifufe tirie m, 
meekwa ka ihe mgbu m baa ụba na-enweghị ihe butere ya. 
 18 Ọ gaghị ekwe ka iku ume m lọghachi 
kama ọ ga-eji iru ụjụ kpuchie m. 
 19 Ọ bụrụ ihe e ji ike eme, lee na ọ dị ike nke ukwuu! 
Ọzọ ọ bụrụ nʼikpe ziri ezi, onye pụrụ iguzogide ya. 
 20 A sịkwarị na aka m dị ọcha, ọnụ m ga-ama m ikpe; 
ọ bụrụ na abụ m onye na-enweghị ịta ụta, ọ ga-agụ m nʼonye ikpe mara. 
 21 “Ọ bụ ezie na abụ m onye ikpe na-amaghị 
ejighị m onwe m kpọrọ ihe; 
nʼezie ana m eleda ndụ m anya. 
 22 Otu ihe ahụ ka ọ bụ; nʼihi ya ka m ji asị, 
‘Ọ na-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi.’ 
 23 Mgbe ịpịa ụtarị wetara ọnwụ mberede, 
ọ na-achị enweghị olileanya nke ndị na-enweghị ihe ha mere ọchị. 
 24 Mgbe ala dabara nʼaka ndị na-emebi iwu, 
ọ na-ekpuchi ndị ọkaikpe anya. 
Ọ bụrụ na ọ bụghị ya na-eme ya, onye kwanụ bụ onye ahụ na-eme ya? 
 25 “Ụbọchị ndụ m dị gara gara karịa onye ọgba ọsọ; 
ha na-agafekwa na-ahụtụghị ọṅụ anya. 
 26 Ha na-agafe dịka ụgbọ mmiri papịrọs,* 9:26 Ọ bụ nʼIjipt ka a na-eji ahịhịa papịrọs arụ ụgbọ epeepe. Ọpụ 2:3 
dịka mgbe ugo na-efeda ngwangwa ijide anụ ọ ga-eri. 
 27 Ọ bụrụ na m sị, ‘Aga m echefu mkpesa m, 
aga m agbanwe ihu m, nwee ihu ọchị.’ 
 28 Nsogbu m niile ka na-atụ m egwu 
nʼihi na amara m na ị gaghị ewere m dịka onye aka ya dị ọcha. 
 29 Ebe m bụrịị onye ikpe mara, 
nʼihi gịnị ka m ji na-adọgbu onwe m nʼefu? 
 30 A sịkwarị na m jiri ncha saa ahụ m 
werekwa soda saa aka m abụọ, 
 31 ị ga-enuba m nʼolulu apịtị 
nke pụrụ ime ka uwe m yi nʼahụ m kpọọ m asị. 
 32 “Ọ bụghị mmadụ efu dịka m nke m ga-aza ya, 
ka anyị abụọ kpọrịtaa onwe anyị ikpe nʼụlọikpe. 
 33 A sịkwarị na e nwere onye odozi okwu nʼetiti mụ na gị, 
onye ga-ebikwasị anyị abụọ aka ya, 
 34 onye ga-ewepụ mkpara Chineke site nʼebe m nọ, 
ka oke egwu ya gharakwa ịtụ m ọzọ. 
 35 Mgbe ahụ ka m ga-ekwu okwu na-atụghị ya egwu; 
ma ka ọ dị ugbu a ọ dịghị ihe m nwere ike ime.