10
Onyenwe anyị ga-elekọta Juda 
 1 Rịọọnụ Onyenwe anyị mmiri ozuzo nʼoge mmiri ozuzo nke ikpeazụ, 
nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-ezite oke amụma mmiri. 
Ọ bụ ya na-enye ụmụ mmadụ mmiri ozuzo, 
na-enyekwa mmadụ niile ihe ọkụkụ nke ubi. 
 2 Arụsị niile na-ekwu okwu aghụghọ, 
ndị na-agba aja nʼahụ ọhụ bụ ụgha, 
ndị ha na-arọ nrọ, na-akọwakwa nrọ ụgha, 
okwu nkasiobi nke ihe na-adịghị nʼime ya ka ha na-enye. 
Ya mere, ndị mmadụ na-akpagharị dịka atụrụ 
a na-akpagbu ha nʼihi enweghị onye ọzụzụ atụrụ. 
 3 “Iwe m na-ere ọkụ megide ndị ọzụzụ atụrụ, 
aga m atakwa ndị ndu* 10:3 Ọ bụ mkpi na-ebuta ụzọ mgbe ha na-aga nʼigwe. niile ahụhụ; 
nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile 
ga-elekọta igwe anụ ụlọ ya, ya bụ ndị Juda, 
ọ ga-eme ka ha dịrị ka ịnyịnya dị ebube nʼagha. 
 4 A ga-esi na Juda nweta nkume bụ ide ji ụlọ,† 10:4 Maọbụ, nkume nkuku ụlọ 
a ga-esi na ha nweta ǹtu ụlọ ikwu, 
a ga-esi na ha nweta ụta a kwadoro maka agha, 
sitekwa na ha nweta ndị ndu dị iche iche. 
 5 Ha niile ga-ejikọta onwe ha ọnụ, dịka ndị bụ dike nʼagha, 
ha ga-azọda ndị iro ha nʼapịtị nke okporoụzọ niile. 
Nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere ha, 
ha ga-alụgbukwa ndị iro niile na-agba ịnyịnya. 
 6 “Aga m eme ka ụlọ Juda dị ike, 
zọpụtakwa ụlọ Josef. 
Aga m eme ka ha lọghachita, 
nʼihi na aga m egosi ha obi ebere. 
Ha ga-adị 
ka ndị m na-ajụghị mgbe ọbụla, 
nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha, 
aga m azakwa arịrịọ ha. 
 7 Ndị Ifrem ga-aghọ ndị dị ike nʼagha, 
ha ga-enwe ọṅụ dịka ndị na-aṅụ mmanya. 
Ụmụ ha ga-ahụ ya ṅụrịakwa ọṅụ, 
ha ga-ejikwa obi ha niile ṅụrịa ọṅụ nʼime Onyenwe anyị. 
 8 Mgbe ahụ, aga m akpọ ha oku, 
chịkọtaa ha. 
Nʼezie, aga m agbapụta ha, 
ha ga-adịkwa ukwuu dịka ha dị na mbụ. 
 9 A sịkwarị na m chụsara ha nʼetiti ndị dị iche iche, 
ma ha ga-echeta m site nʼala niile ahụ dị anya. 
Ha na ụmụ ha ga-adịkwa ndụ; 
ha ga-alọtakwa. 
 10 Aga m esi nʼala Ijipt kpọlata ha, 
sitekwa nʼAsịrịa chịkọtaa ha. 
Aga m akpọta ha na Gilead na Lebanọn. 
Ha agaghị enwekwa ebe ga-ezuru ha niile. 
 11 Ha ga-esi nʼosimiri nsogbu gafee. 
A ga-emekwa ka mmali elu nke osimiri dajụọ. 
Ebe obibi niile nke osimiri Naịl ga-atakọrọkwa. 
A ga-egbuda mpako niile nke Asịrịa, 
wezugakwa mkpara ọchịchị nke ndị Ijipt. 
 12 Aga m eme ka ha dị ike nʼime Onyenwe anyị, 
ọ bụkwa nʼaha ya ka ha ga na-ejegharị nʼudo.” 
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.