6
Ndị Enyi 
 1 Gị onye mara mma nʼetiti ndị inyom, 
ebee ka onye ị hụrụ nʼanya jere? 
Olee ụzọ o sitere? 
Ka anyị soro gị chọọ ya. 
Onye a hụrụ nʼanya 
 2 Ọ gara nʼubi ya a gbara ogige, 
nʼebe ihe ndina ya nke e fesara ụda na-esi isi ụtọ, 
ijegharị nʼetiti okoko urodi, 
na ịchịkọta okoko lili. 
 3 Abụ m nke onye m hụrụ nʼanya, onye m hụrụ nʼanya bụkwa nke m. 
Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi. 
Onye hụrụ ibe ya nʼanya 
 4 Onye m hụrụ nʼanya, ị mara mma dịka Tịaza, ị mara mma nke ukwu dịka Jerusalem, ị dị ebube ka usuu ndị agha ji ọkọlọtọ.* 6:4 Tịaza bụ obodo ochie eze Jeroboam họpụtara ka ọ bụrụ isi obodo ọchịchị nke alaeze ugwu. Ọ bụ na senchuri nke iri (Tupu a mụọ Kraịst). 1Ez 14:17; 1Ez 15:21,33; 16:6,8,15,23 
Ị dị mma ile anya dịka Jerusalem; 
Ị dị ka ndị agha bu ọkọlọtọ. 
 5 Wepụ anya gị nʼebe m nọ, 
nʼihi na i jirila anya gị dọta m. 
Agịrị isi gị dị ka igwe ewu† 6:5  Abk 4:2 
nke na-arịdata site nʼugwu Gilead. 
 6 Eze gị dị ka igwe atụrụ 
nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta. 
Nke ọbụla chi ụmụ abụọ, 
ọ dịghịkwa nke nwa ya furu efu nʼetiti ha. 
 7 Agba ntị gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị 
dị ka pomegranet e kere abụọ. 
 8 E nwere ike nwee iri eze nwanyị isii, 
na iri ndị iko nwanyị asatọ, 
na ọtụtụ ụmụ agbọghọ a na-apụghị ịgụta ọnụ, 
 9 ma gị onwe gị, nduru m, ezigbo m zuruoke, pụrụ iche nʼetiti ha niile. 
Naanị otu nwanyị nne ya nwere, 
ọ masịrị onye mụrụ ya. 
Ụmụ agbọghọ hụrụ ya kpọọ ya onye a gọziri agọzi, 
ndị eze nwanyị na ndị iko nwanyị tooro ya. 
Ndị Enyi 
 10 Onye bụ onye a, pụtara ihe dịka chi ọbụbọ, 
nke mara mma dịka ọnwa, na-enwu dịka anyanwụ, 
dị ebube ka dị usuu kpakpando na-aga nʼahịrị nʼahịrị? 
Onye hụrụ ibe ya nʼanya 
 11 Agara m nʼubi a gbara ogige ebe a kụrụ mkpụrụ osisi, 
ile ihe na-etopụta ọhụrụ na ndagwurugwu, 
ilekwa akwụkwọ ndụ ọhụrụ ndị na-epupụta nʼosisi vaịnị, 
na ị mata ma nʼosisi pomegranet ọ mara ifuru. 
 12 Tupu m mata ebe m nọ, 
agụ nke mkpụrụobi m adọtala m tinye nʼetiti ụgbọ agha nke ndị eze ala m. 
Ndị Enyi 
 13 Laghachi azụ, gị onye Shulam, laghachi azụ; 
laghachi azụ, e, laghachi azụ ka anyị lee gị anya. 
Onye hụrụ ibe ya nʼanya 
Maka gịnị ka unu ga-eji lee onye Shulam anya 
dịka ọ bụ ite egwu ndị Mahanaim?