3
 1 Achọrọ m onye m hụrụ nʼanya 
nʼelu ihe ndina m nʼabalị, ma ahụghị m ya. 
Ebiliri m chọọ ya ma ahụghị m ya. 
 2 Ugbu a, aga m ebili pụọ jegharịa nʼama niile 
na nʼokporoụzọ niile nke obodo ịchọ ya, 
m ga-achọgharị onye m hụrụ nʼanya. 
Ya mere, achọrọ m ya ma ahụghị m ya. 
 3 Ndị nche na-eche obodo* 3:3  Aịz 21:11-12 hụrụ m, 
mgbe ha na-agagharị nʼobodo, 
ma ajụrụ m ha sị, “Biko, unu hụrụ onye ahụ m hụrụ nʼanya?” 
 4 Ọ dịghị anya mgbe m gafere ha, 
achọtara m onye m hụrụ nʼanya, 
ejidesiri m ya ike, ahapụghị m ya aka 
tutu m duta ya nʼụlọ nne m, 
nʼime ụlọ nwanyị tụrụ ime m. 
 5 Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, 
eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa gbaa unu iyi sị, 
unu akpọtela, maọbụ mee ka ịhụnanya teta 
ruo mgbe o masịrị ya. 
 6 Onye bụ nke a na-esi nʼọzara na-abịa 
dịka anwụrụ ọkụ, 
nke tere mmanụ máá na ụda na-esi isi ụtọ, 
ụda nke ndị ahịa na-ere? 
 7 Lee ọ bụ ụgbọ Solomọn. 
Iri mmadụ isii ndị ọka agha, 
ndị a maara aha ha karịsịa nʼala Izrel sokwa ya. 
 8 Ha niile ji mma agha; 
ha bụ ndị a zụrụ nke ọma ibu agha. 
Mma agha onye ọbụla dịkwa nʼukwu ya, 
ịdị njikere maka ihe egwu abalị. 
 9 Eze Solomọn rụrụ onwe ya ụgbọ a 
nke o ji osisi sitere Lebanọn rụọ. 
 10 Ogidi ya ka o ji ọlaọcha mee; 
ala ya bụkwa ọlaedo. 
Ebe ịnọdụ ọdụ ya ka e ji akwa odo odo kpaa, 
e ji ịhụnanya dozie ebe ime ya. 
Ndị inyom Jerusalem,  11 pụtanụ, 
bịa hụrụ, unu ụmụ agbọghọ Zayọn, 
bịanụ ka unu hụ Solomọn bụ eze; 
lee ụdị okpueze nne ya kpunyere ya nʼisi, 
nʼụbọchị agbamakwụkwọ ya, 
nʼụbọchị obi ụtọ na ịṅụrị ọṅụ ya.