2
Onye a hụrụ nʼanya 
 1 Abụ m okoko osisi ọhịa nke Sharọn,* 2:1 Okoko osisi a bụ otu nʼime okoko osisi ndị na-epu nʼọkọchị, na ndịda akụkụ osimiri Kamel Aịz 35:1-2 
na okoko lili nke na-epu na ndagwurugwu. 
Onye hụrụ ibe ya nʼanya 
 2 E, dịka okoko lili nke na-epu nʼetiti ogwu, 
otu a ka ọmasịrị m dị nʼetiti ụmụ agbọghọ ndị ọzọ. 
Onye a hụrụ nʼanya 
 3 Onye m hụrụ nʼanya dịka osisi apụl, nʼetiti osisi na-amị mkpụrụ nʼọhịa, 
mgbe e ji ya tụnyere ụmụ okorobịa ndị ọzọ. 
Ọ na-enye m obi ụtọ ịnọ nʼokpuru ndo ya, 
mkpụrụ ya dịkwa ụtọ nʼọnụ. 
 4 Ka ọ kpọrọ m jee nʼụlọ oriri, 
ka ọkọlọtọ ya nʼekpuchi m bụrụ ịhụnanya. 
 5 Were mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ gbaa m ume; 
werekwa mkpụrụ osisi apụl mee ka ahụ m dị ike, 
nʼihi na abụ m onye ịhụnanya mere ka ike gwụsịa. 
 6 Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m, 
aka nri ya na-ejikụ m. 
 7 Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, 
eji m nne mgbada niile na nne ele ọhịa niile na-agba unu iyi sị: 
Unu akpọtela maọbụ mee ka ịhụnanya teta, 
ruo mgbe ọ masịrị ya. 
 8 Gee ntị! Onye m hụrụ nʼanya! 
Lee ya ka ọ na-abịa, 
na-amali elu nʼelu ugwu niile, 
na-amafekwa nʼelu ugwu nta niile. 
 9 Onye m hụrụ nʼanya yiri mgbada, o yiri nwa ele. 
Lee ya ka ọ na-eguzo nʼazụ mgbidi anyị, 
ọ na-esikwa na oghereikuku 
na nʼoghere dị ya na-elebata anya. 
 10 Onye m hụrụ nʼanya gwara m okwu sị m, 
“Bilie, onye ihe ya na-atọ m ụtọ, 
onye m mara mma, soro m. 
 11 Lee, oge oyi agafeela, 
udu mmiri agabigakwala. 
 12 Okoko osisi epupụtala nʼala; 
oge eji agụ egwu eruokwala, 
a na-anụ abụ nduru 
nʼala anyị niile. 
 13 Mkpụrụ osisi fiig ebidola ịmịpụta mkpụrụ ya nke mbụ,† 2:13 Osisi fiig na-amị mkpụrụ ugboro abụọ nʼafọ nʼIzrel. Ọ bụ nʼoge ọkọchị ka ọ kachasị amị mkpụrụ, amaokwu a na-ekwu banyere owuwe ihe ubi nke mkpụrụ fiig mbụ. 
isi osisi vaịnị na-amịpụta okoko na-esiju ebe niile. 
Bilie, ma bịa, ọmasịrị m. 
Onye nke m mara mma! Bịa ka i sooro m.” 
Onye hụrụ ibe ya nʼanya 
 14 Nduru m nọ nʼọgba nkume, 
nʼebe nzuzo nke akụkụ ugwu, 
gosi m ihu gị, 
mee ka m nụ olu gị, 
nʼihi na olu gị dị ụtọ, 
ihu gị makwara mma. 
 15 Jidenụ nkịta ọhịa, 
ụmụ nkịta ọhịa niile 
na-emebiri anyị ubi, 
ọ bụladị ubi vaịnị anyị na-agbawa okoko. 
Onye a hụrụ nʼanya 
 16 Onye m hụrụ nʼanya bụ nke m, mụ onwe m bụkwa nke ya. 
Ọ na-azụ igwe atụrụ ya nʼetiti okoko urodi, 
 17 tutu chi ụtụtụ abọọ 
mgbe onyinyo niile na-agabigakwa. 
Tụgharịa, onye m hụrụ nʼanya, 
dị ka mgbada 
maọbụ nwa ele 
nke nọ nʼelu ugwu.