Abụ Ọma 149
Abụ otuto 
 1 Toonu Onyenwe anyị! 
Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ ọhụrụ. 
Bụọnụ abụ ito ya nʼetiti ndị nsọ ya. 
 2 Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ nʼime onye kere ha; 
ka ndị bi na Zayọn nwee obi ụtọ nʼime Eze* 149:2  Nkp 8:23; Zek 9:9; Mat 21:5 ha. 
 3 Ka ha jiri ite egwu too aha ya 
ka ha jiri ọyọ na ụbọ akwara kpọọrọ ya egwu. 
 4 Nʼihi na ihe banyere ndị ya na-atọ Onyenwe anyị ụtọ. 
Ọ na-eji nzọpụta† 149:4  Abụ 132:16; Aịz 61:10 kpukwasị ndị dị umeala nʼobi nʼisi dịka okpueze. 
 5 Ka ndị nsọ ṅụrịa ọṅụ nʼime nsọpụrụ a, 
bụkwaa abụ nʼihi ọṅụ nʼelu ihe ndina ha. 
 6 Ka otuto Chineke dịrị nʼọnụ ha, 
ka mma agha ihu abụọ‡ 149:6  Hib 4:12; Mkp 1:16 dịrịkwa nʼaka ha, 
 7 iji bọọrọ mba niile ọbọ 
taakwa ndị niile dị iche iche ahụhụ, 
 8 iji mkpọrọ igwe kee ndị eze ha 
na ndị ha a na-asọpụrụ agbụ igwe, 
 9 imezu ihe ahụ e kpebiri, depụtakwa megide ha. 
Nke a bụ nsọpụrụ dịrị ndị nsọ ya. 
Toonu Onyenwe anyị. 
*Abụ Ọma 149:2 149:2 Nkp 8:23; Zek 9:9; Mat 21:5
†Abụ Ọma 149:4 149:4 Abụ 132:16; Aịz 61:10
‡Abụ Ọma 149:6 149:6 Hib 4:12; Mkp 1:16