Abụ Ọma 140
Abụ nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. 
Ekpere maka nchebe 
 1 O Onyenwe anyị, dọpụta m site nʼaka ndị na-eme ihe ọjọọ. 
Chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike dị iche iche. 
 2 Ndị na-atụ atụmatụ ime ihe ọjọọ nʼobi ha 
na-akpali agha ụbọchị niile. 
 3 Ha na-eme ire ha ka ha dị nkọ dịka nke agwọ; 
elo ajụala dị nʼegbugbere ọnụ ha.* 140:3  Rom 3:13; Jem 3:8
Sela
  4 Chebe m Onyenwe anyị, ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-emebi iwu; 
chebe m ka m ghara ịdaba nʼaka ndị na-eme ihe ike, 
ndị na-eche echiche ọdịda m. 
 5 Ndị mpako esielera m ọnya igbudu; 
ha agbasaala ụgbụ ha na udo ha, 
siekwara m ọnya dị iche iche nʼụzọ m na-aga. 
Sela
  6 A sịrị m Onyenwe anyị, “Gị onwe gị bụ Chineke m.” 
Nụrụ, O Onyenwe anyị, olu arịrịọ m maka amara. 
 7 Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị Onye nzọpụta m dị ike, 
ị na-ekpuchi isi m nʼụbọchị agha. 
 8 Ekwekwala ka ndị ajọ omume chọta ihe ha na-achọ, o Onyenwe anyị, 
ekwekwala ka nzube ha mezuo. 
Sela
  9 Ndị niile gbara m gburugburu na-ebuli isi ha elu na nganga 
ka ndụ ọjọọ nke egbugbere ọnụ ha rikpuo ha. 
 10 Ka icheku ọkụ na-ere ere dakwasị ha; 
ka a tụba ha nʼime ọkụ na-ere ere, 
nʼime olulu apịtị jupụtara, nke ha na-enweghị ike isite nʼime ya pụta ọzọ. 
 11 Ekwela ka ndị na-ekwu okwu nkwulu guzosie ike nʼala, 
ka ihe ọjọọ chụda ndị na-eme ihe ike. 
 12 Amaara m na Onyenwe anyị ga-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ogbenye 
na-emekwa ka ndị nọ na mkpa nweta ihe ruuru ha. 
 13 Nʼezie, ndị ezi omume ga-eto aha gị, 
ndị ziri ezi ga-ebikwa nʼihu gị.