Abụ Ọma 84
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Abụ Ọma ụmụ Kora nʼusoro gittit. 
Agụụ nke ụlọnsọ Chineke 
 1 Lee ka ebe obibi gị sị maa mma, 
O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile! 
 2 Ọ na-agụsị mkpụrụobi m agụụ ike, e mkpụrụobi m na-adakwa mba, 
ịbata nʼogige Onyenwe anyị; 
mkpụrụobi m na anụ ahụ m na-eti mkpu 
na-achọ Chineke dị ndụ. 
 3 Ọ bụladị ụmụ nnụnụ nta nke eluigwe, achọtala ebe obibi; 
eleke achọtakwarala onwe ya akwụ, 
ebe ọ ga na-edebe ụmụ ya, 
nʼakụkụ ebe ịchụ aja nsọ gị, 
O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Eze m na Chineke m. 
 4 Ndị a gọziri agọzi ka ndị bi nʼụlọ gị bụ; 
ha na-eto gị mgbe niile. 
Sela
  5 Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ike ha nwere dị na gị, 
ndị kpebiri nʼobi ha ịga njem. 
 6 Mgbe ha na-esite na Ndagwurugwu Baka na-agafe, 
ha na-eme ya ka ọ bụrụ ebe isi iyi dị iche iche na-asọpụta; 
mmiri ozuzo mbụ na-ewere ngọzị niile kpuchie ya.* 84:6 Na-ewere ọdọ mmiri kpuchie ya 
 7 Ike ha na-abawanye abawanye, 
tutu ha niile nʼotu na otu, abịa guzo nʼihu Chineke na Zayọn. 
 8 O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nụrụ ekpere m. 
Gee m ntị, gị Chineke nke Jekọb. 
 9 Lekwasị anya nʼọta anyị, O Chineke, 
jiri ihuọma lekwasị onye gị e tere mmanụ anya. 
 10 Otu mkpụrụ ụbọchị a nọrọ nʼime ogige gị, 
karịrị puku ụbọchị a nọrọ ebe ọzọ; 
ọ ga-akara m mma ịbụ onye nche nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ Chineke m, 
karịa ibi nʼụlọ ikwu nke ndị ajọ omume. 
Onyenwe anyị na-enye ihuọma na nsọpụrụ; 
ọ naghị egbochi ihe ọma ọbụla 
site nʼebe ndị na-eje ije nʼizuoke nọ. 
 12 O Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, 
ngọzị na-adịrị ndị niile na-atụkwasị gị obi.