Nchịkọta Akwụkwọ nke atọ 
 73
Abụ Ọma 73–89 
Abụ Ọma Asaf. 
Ọgwụgwụ nke ndị na-emebi iwu 
 1 Nʼezie, Chineke dịịrị Izrel mma, 
dịkwara ndị obi ha dị ọcha. 
 2 Ma mụ onwe m, ọ fọdụrụ nwantịị ka m zọhie ụkwụ, 
ọ fọdụrụ nwantịị ka ụkwụ m gbụchapụ. 
 3 Nʼihi na e kwosara m ndị mpako ekworo* 73:3  Abụ 37:1,7; Ilu 23:17; 
mgbe m hụrụ ịba ụba† 73:3 Maọbụ, udo nke ndị ajọ omume.‡ 73:3  Job 21:5-16; Jer 12:1 
 4 Ha anaghị adọgbu onwe ha; 
ahụ ha gbara abụba, siekwa ike. 
 5 Nsogbu niile mmadụ ibe ha na-enwe adịghị erute ha. 
Ha enweghị mkpa ọbụla nke na-akpa ha dịka ndị ọzọ nwere. 
 6 Nʼihi nke a, nganga bụ ihe ịnya nʼolu ha; 
ha jikwa ihe ike kpuchie onwe ha dịka uwe. 
 7 Mmehie na-esite nʼobi ọjọọ ha apụta; 
echiche ọjọọ ha enweghị ngụta. 
 8 Ha na-akwa emo, na-ejikwa iro ekwu okwu; 
nʼime mpako ha, ha na-aba mba imegbu ndị ọzọ. 
 9 Ha ji ọnụ ha na-ekwu na eluigwe bụ nke ha, 
ha jikwa ire ha kwuo na ụwa niile bụ nke ha. 
 10 Nʼihi nke a, ndị ha na-eso ha, 
na-aṅụrụ okwu ha ebe ọ bara ụba dịka mmiri. 
 11 Ha na-asị, “Olee otu Chineke ga-esi mara? 
Ọ dịkwanụ ihe Onye kachasị ihe niile elu maara?” 
 12 Otu a ka ndị ajọ omume dị, 
ha na-ebi ndụ na-enweghị nsogbu; akụnụba ha na-amụbakwa. 
 13 Nʼezie, ọ bụ naanị nʼefu ka m debere obi m ọcha, 
nʼefu ka m kwọrọ aka§ 73:13 Biri ndụ na-enweghị ntụpọ m abụọ nʼemeghị ihe ọjọọ. 
 14 Ogologo ụbọchị niile, anọ m na nsogbu; 
ụtụtụ niile ka m na-anata ntaramahụhụ. 
 15 Ọ bụrụ na m kwuru sị, “Nke a ka m ga-ekwu,” 
agaara m abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼetiti ụmụ gị. 
 16 Mgbe m gbalịrị ịghọta ihe ndị a niile, 
ọ ghọọrọ m ihe mwute, 
 17 tutu ruo mgbe m bara nʼebe nsọ Chineke; 
mgbe ahụ ka m ghọtara ihe ga-eme ha nʼikpeazụ. 
 18 Nʼezie, ị na-eguzo ha nʼala na-achị achị; 
ị na-atụda ha, laa ha nʼiyi. 
 19 Lee, ka ha si laa nʼiyi nʼotu ntabi anya, 
bụrụ ndị ihe egwu dị iche iche kpochapụrụ kpamkpam! 
 20 Dịka nrọ, mgbe mmadụ na-eteta, 
otu a, O Onyenwe anyị, mgbe i tetara, 
ị ga-eleda ha anya dịka echiche na-agaghị emezu. 
 21 Mgbe m nọ nʼobi mwute; 
mmụọ m dara mba. 
 22 Abụ m onye nzuzu na onye na-amaghị ihe. 
Adị m ka anụ ọhịa nʼihu gị. 
 23 Ma ana m anọnyere gị mgbe niile; 
ị na-ejide m nʼaka nri m. 
 24 Ị na-eji ndụmọdụ gị na-edu m, 
ma emesịa, ị ga-anabata m nʼebube gị. 
 25 Onye ka m nwere nʼeluigwe ma ọ bụghị gị? 
Ọ dịghị ihe ụwa a nwere nke m ga-achọsi ike karịa gị. 
 26 Anụ ahụ m na mkpụrụobi m nwere ike ịda mba, 
ma Chineke bụ ike nke obi m, 
na ihe nketa m ruo ebighị ebi. 
 27 Ndị niile nọpụrụ gị nʼebe dị anya ga-ala nʼiyi. 
Ị ga-alakwa ndị niile na-ekwesighị ntụkwasị obi, nye gị nʼiyi. 
 28 Ma nye mụ onwe m, ọ dị mma ịnọ Chineke nso. 
Emeela m Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ebe mgbaba m. 
Aga m akọ banyere ọrụ gị niile dị iche iche. 
*Abụ Ọma 73:3 73:3 Abụ 37:1,7; Ilu 23:17
†Abụ Ọma 73:3 73:3 Maọbụ, udo
‡Abụ Ọma 73:3 73:3 Job 21:5-16; Jer 12:1
§Abụ Ọma 73:13 73:13 Biri ndụ na-enweghị ntụpọ