Abụ Ọma 72
Abụ nke Solomọn. 
Ekpere maka eze 
 1 O Chineke, jiri ikpe ziri ezi mejupụta eze. 
Nyekwa nwa eze ezi omume gị. 
 2 Ọ ga-eji ezi omume chịa ndị gị, 
jiri ikpe ziri ezi chịa ndị a na-emegbu. 
 3 Ka ugwu niile wetara ndị mmadụ ịba ụba; 
ugwu nta niile wetakwara ha mkpụrụ ezi omume. 
 4 Ọ ga-ekpepụta ndị a na-emegbu nʼetiti ndị mmadụ, 
zọpụtakwa ụmụntakịrị ndị nọ na mkpa; 
ọ ga-egwepịa onye mmegbu. 
 5 Ka ọ dịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ na-adịgide, 
dịka ọnwa na-adịgidekwa ruo ọgbọ niile. 
 6 Ọ ga-adị ka mmiri na-ezokwasị ala ubi a sụrụ asụ, 
dịka mmiri ozuzo na-ede elu ala. 
 7 Nʼoge ndụ ya, ka ndị ezi omume too, na-awasa; 
ịba ụba ga-ejupụta ebe niile ruo mgbe ọnwa agaghị adịkwa. 
 8 Ọ ga-achị site nʼosimiri ruo osimiri, 
na-esite nʼiyi ukwu.* 72:8 Nke a na-ekwu banyere osimiri Yufretis. Mgbe Solomọn na-achị, ọ bụ nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala Izrel ka ọ dị. Ọ bụ otu ihe e kwere ndị Izrel na nkwa mgbe ha si nʼọnọdụ ohu na-ahapụ Ijipt. Ọpụ 23:31; Zek 9:10 ruo na nsọtụ niile nke ụwa† 72:8 Ọ bụ site nʼosimiri Mediterenịa ruo nʼosimiri Nwụrụ anwụ, ka a maara dị ka nsọtụ ụwa nʼoge ahụ. 
 9 Ebo niile ndị bi nʼọzara ga-akpọ isiala nye ya, 
ndị iro ya niile ga-abụ ndị e wedara nʼala. 
 10 Ndị eze Tashish‡ 72:10 Obodo Tashish dị nʼala Spen, ọ nọchiri anya nsọtụ nke ụwa, 2Ih 9:21 na mba niile dị nʼebe dị anya, 
ga-atụ ụtụ wetara ya; 
e, ọ bụladị ndị eze si Sheba na Seba,§ 72:10 Ala Sheba dị nʼArebịa, ebe ala Seba dị nʼAfrika. 
ga-ewetara ya ọtụtụ onyinye. 
 11 Ndị eze niile ga-akpọ isiala nye ya, 
mba niile ga-ejekwara ya ozi. 
 12 Nʼihi na ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa mgbe ha kpọkuru ya. 
Ọ ga-azọpụtakwa ndị ogbenye na-enweghị onye ga-enyere ha aka. 
 13 Ọ ga-enwe ọmịiko nʼahụ ndị na-enweghị ike, na ndị nọ na mkpa, 
ọ ga-azọpụta ndị nọ na mkpa site nʼọnwụ. 
 14 Ọ ga-azọpụta ha site na mkpagbu na ihe ike, 
nʼihi na ndụ ha dị oke ọnụahịa nʼanya ya. 
 15 Ka ọ dị ogologo ndụ! 
Ka e nye ya ọlaọcha e wetara na Sheba. 
Ka ndị mmadụ na-ekpere ya ekpere mgbe niile, 
ma gọziekwa ya ogologo ụbọchị niile. 
 16 Ka mkpụrụ ọka jupụta nʼebe niile nʼala a; 
ka ha na-efufegharị nʼelu ugwu niile. 
Ka mkpụrụ ubi ya wasaa dịka Lebanọn; 
ka mmadụ jupụta nke ọma nʼobodo dịka ahịhịa ndụ nke ọhịa. 
 17 Ka aha ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; 
ka ọ na-adịgide ruo mgbe niile dịka anyanwụ si adịgide. 
A ga-esite na ya gọzie mba niile, 
a ga-akpọ ya onye a gọziri agọzi. 
 18 Otuto dịrị Onyenwe anyị Chineke, Chineke nke Izrel, 
onye naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche. 
 19 Otuto dịrị aha ya dị ebube ruo ebighị ebi; 
ka ụwa niile jupụta nʼebube ya. 
Amen na Amen. 
 20 Nke a bụ ọgwụgwụ ekpere Devid nwa Jesi. 
*Abụ Ọma 72:8 72:8 Nke a na-ekwu banyere osimiri Yufretis. Mgbe Solomọn na-achị, ọ bụ nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ala Izrel ka ọ dị. Ọ bụ otu ihe e kwere ndị Izrel na nkwa mgbe ha si nʼọnọdụ ohu na-ahapụ Ijipt. Ọpụ 23:31; Zek 9:10
†Abụ Ọma 72:8 72:8 Ọ bụ site nʼosimiri Mediterenịa ruo nʼosimiri Nwụrụ anwụ, ka a maara dị ka nsọtụ ụwa nʼoge ahụ.
‡Abụ Ọma 72:10 72:10 Obodo Tashish dị nʼala Spen, ọ nọchiri anya nsọtụ nke ụwa, 2Ih 9:21
§Abụ Ọma 72:10 72:10 Ala Sheba dị nʼArebịa, ebe ala Seba dị nʼAfrika.