Abụ Ọma 71
Ekpere maka ndụ ogologo 
 1  Onyenwe anyị, nʼime gị ka m gbabara izere ndụ; 
ekwela ka ihere mee m. 
 2 Site nʼezi omume gị, gbapụta m, mee ka m nwere onwe m; 
tọọ ntị gị nʼala nụrụ olu m ma zọpụta m. 
 3 Ghọọrọ m oke nkume nke ebe mgbaba, 
ebe m nwere ike ịgbaba mgbe ọbụla; 
nye iwu maka nzọpụta m, 
nʼihi na ị bụ oke nkume m na ebe m e wusiri ike. 
 4 O Chineke m, site nʼaka ndị ajọ omume na ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ, 
ndị afọ tara mmiri, gbapụta m. 
 5 Nʼihi na gị onwe gị bụrịị olileanya m, Onyenwe m Onyenwe anyị, 
ntụkwasị obi m site na mgbe m bụ nwantakịrị.* 71:5  Jer 14:8; Jer 17:7,13 
 6 Ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi, site nʼoge amụrụ m; 
gị onwe gị wepụtara m site nʼafọ nne m. 
Aga m anọgide na-eto gị. 
 7 Adịla m ka ihe ama nye ọtụtụ mmadụ, 
ma ị bụ ebe mgbaba m siri ike. 
 8 Ọnụ m jupụtara nʼotuto gị, 
ọ na-ekwupụta ịma mma gị ogologo ụbọchị niile. 
 9 Agbakụtala m azụ mgbe m mere agadi; 
ahapụkwala m mgbe ike adịghịkwa m. 
 10 Nʼihi na ndị iro m na-ekwu okwu megide m; 
ndị ahụ na-achọ igbu m na-agbarịta izu nzuzo. 
 11 Ha na-asị, “Chineke agbakụtala ya azụ; 
chụọ ya ọsọ, jidekwa ya, 
nʼihi na o nweghị onye ọbụla ga-agbapụta ya.” 
 12 O Chineke, anọla m ebe dị anya; 
O Chineke m, bịa ngwangwa nyere m aka. 
 13 Ka e were ihere kpuchie ndị na-ebo m ebubo ụgha; 
ka ihere na nleda anya bụrụ ihe ga-ekpuchi 
ndị ahụ na-achọ imerụ m ahụ. 
 14 Ma mụ onwe m ga-anọgide na-enwe olileanya mgbe niile; 
aga m eto gị mgbe niile karịa otu m toro gị na mbụ. 
 15 Ọnụ m ga-ekwu banyere ezi omume gị 
na nzọpụta gị ogologo ụbọchị niile, 
ọ bụ ezie na-amaghị m ọtụtụ ya. 
 16 Aga m abịa kwusaakwa ịdị ukwu ọrụ gị niile, Onyenwe m Onyenwe anyị, 
aga m ekwusa ezi omume gị, e, naanị nke gị. 
 17 O Chineke, site na mgbe m bụ nwantakịrị, i kuzielera m ihe, 
ruo taa, ana m ekwupụta banyere ọrụ ebube gị niile. 
 18 O Chineke m, ọ bụladị mgbe m mere agadi, 
mgbe isi awọ juru m isi, ahapụla m, 
tutu ruo mgbe m ga-ekwupụta ike gị nye ọgbọ nke na-abịa, 
na ịdị ike gị nye ndị niile na-abịa nʼoge dị nʼihu. 
 19 O Chineke, ezi omume gị na-eru nʼeluigwe, 
gị onye merela ọtụtụ ihe dị ukwu. 
O Chineke, onye dị ka gị? 
 20 Nʼagbanyeghị na i meela ka m gabiga ọtụtụ nsogbu 
nke dị ilu, 
ị ga-atụte ndụ m ọzọ; 
site nʼebe dị omimi nke ụwa, 
ị ga-adọkpụpụta m ọzọ. 
 21 Ị ga-eme m ka m dịrị ukwuu karịa ka m dị na mbụ. 
Ị ga-akasịkwa m obi ọzọ. 
 22 O Chineke m, aga m eji ụbọ akwara too gị, 
nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị; 
aga m eji une bụkuo gị abụ otuto, 
gị Onye nsọ nke Izrel. 
 23 Egbugbere ọnụ m ga-eti mkpu ọṅụ 
mgbe m na-abụku gị abụ otuto, 
mụ, onye ị gbapụtara. 
 24 Ogologo ụbọchị niile, aga m ekwupụta 
ọrụ ezi omume gị niile, 
nʼihi na ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ, 
ka e tinyere nʼọnọdụ ihere na ọgbaaghara.