Abụ Ọma 67
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma. Otu Abụ. 
Abụ ekele 
 1 Ka Chineke meere anyị amara ma gọzie anyị, 
ma mee ka ihu ya chakwasị anyị,* 67:1  Ọnụ 6:25
Sela
  2 Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa, 
marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile. 
 3 Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; 
ka mmadụ niile too gị. 
 4 Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ, 
nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ, 
na-edukwa mba niile nke ụwa. 
Sela
  5 Ka mmadụ niile too gị, O Chineke; 
ka mmadụ niile too gị. 
 6 Mgbe ahụ, ala ga-amịpụta ihe owuwe ubi ya, 
Chineke, onye bụ Chineke anyị, ga-agọzikwa anyị. 
 7 Chineke ga-agọzi anyị, 
nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.