Abụ Ọma 66
Abụ dịrị onyeisi abụ. Otu Abụ. Abụ Ọma. 
Abụ ekele 
 1 Ụwa niile, jirinụ ọṅụ tikuo Chineke! 
 2 Bụọ abụ banyere ebube aha ya; 
meenụ ka otuto ya bụrụ ihe dị ebube! 
 3 Gwa Chineke okwu sị ya, “Lee ka ọrụ gị niile si dị oke egwu! 
Ike gị dị nnọọ ukwu, 
ya mere ndị iro gị, na-ada nʼihu gị nʼihi ụjọ. 
 4 Ndị niile bi nʼụwa na-akpọ isiala nye gị; 
ha na-abụku gị abụ otuto, 
ha na-abụ abụ otuto nye aha gị.” 
Sela
  5 Bịa lee ihe Chineke mere, 
ụdị ọrụ oke egwu ọ na-arụ nʼihi mmadụ! 
 6 O mere ka osimiri ghọọ ala akọrọ,* 66:6  Ọpụ 14:22 
ha ji ụkwụ si nʼetiti osimiri gafee† 66:6  Jos 3:14-16; 
bịanụ ka anyị ṅụrịa nʼime ya. 
 7 Ọ na-achị ruo mgbe ebighị ebi site nʼike ya, 
anya ya na-elekwa mba niile, 
ka ndị nnupu isi ghara ịfụlị onwe ha elu megide ya. 
Sela
  8 Toonu Chineke anyị, unu mmadụ niile, 
kwere ka a nụ ụda otuto ya; 
 9 O chebela ndụ anyị, 
ma mee ka ụkwụ anyị ghara ịmịchapụ. 
 10 Nʼihi na ọ bụ gị, O Chineke, nwara anyị; 
ị nụchara anyị dịka ọlaọcha. 
 11 Ị kpọbatara anyị nʼụlọ mkpọrọ, 
ma bokwasị ibu dị arọ nʼazụ anyị. 
 12 I kwere ka ndị mmadụ rịa anyị elu; 
anyị esitela nʼime ọkụ na nʼime mmiri gafee. 
Ị kpọbatala anyị ebe anyị nwezuru ihe niile. 
 13 Aga m e ji aja nsure ọkụ bata nʼime ụlọnsọ ukwu gị, 
imezu nkwa m kwere gị 
 14 nʼihi na nke a bụ ihe m ji ọnụ m kwuo, 
ọ bụkwa nke a ka egbugbere ọnụ m kwupụtara na m ga-eme nʼoge nsogbu m. 
 15 Aga m eji anụ ndị gbara abụba chụọrọ gị aja, 
ya na aja onyinye nke ọtụtụ ebule; 
Aga m achụkwa aja onyinye nke ọtụtụ oke ehi na mkpi. 
Sela
  16 Bịanụ nụrụ, unu niile na-atụ egwu Chineke; 
ka m kọọrọ unu ihe o meere m. 
 17 Eji m ọnụ m kpọkuo ya; 
otuto ya dị m nʼire. 
 18 Ọ bụrụ na mmehie na-amasị m nʼime obi m, 
Onyenwe anyị agaraghị ege m ntị; 
 19 ma Chineke gere ntị nʼezie, 
nụrụkwa olu arịrịọ m. 
 20 Otuto dịrị Chineke, 
onye na-ajụghị ekpere m 
maọbụ ghara izi m ịhụnanya ya!