Abụ Ọma 65
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid. Otu Abụ. 
Ịdị mma na ịdị ike nke Chineke 
 1 I kwesiri otuto, O Chineke, nʼime Zayọn; 
ọ bụ gị ka anyị ga-emezuru nkwa anyị, 
 2 O gị onye na-anụ ekpere, 
ọ bụ gị ka mmadụ niile ga-abịakwute,* 65:2  Aịz 66:23 
 3 Mgbe mmehie na-anyịgbu anyị, 
ị gbaghara anyị njehie anyị niile. 
 4 Ngọzị na-adịrị ndị ahụ ị họpụtara, 
ka ha bịaruo nso, ibi nʼebe obibi gị! 
E ji ọtụtụ ezi ihe nke ụlọ gị, nke ụlọnsọ ukwuu gị, 
mee ka afọ ju anyị. 
 5 O Chineke, Onye nzọpụta anyị, 
i ji ọrụ ezi omume dị oke egwu na-aza anyị, 
ị bụ olileanya ndị niile bi na nsọtụ nke ụwa, 
na osimiri niile dị ebe dị anya, 
 6 onye ji ike ya kpụọ ugwu niile, 
ebe i yikwasịrị onwe gị ike dịka ngwa agha, 
 7 onye mere ka ụda olu oke osimiri niile 
na ụda olu ebili mmiri, 
na ọgbaaghara mba niile deere duu. 
 8 Ụwa niile jupụtara nʼịtụnanya nʼihi ọrụ ebube gị niile, 
nʼebe chi na-abọ, ebe anyanwụ na-ada, 
ka ị na-akpọlite abụ ọṅụ. 
 9 Ị na-elekọta ala na-agba ya mmiri; 
ị na-eme ka ọ bụrụ ala dị mma. 
Isi iyi Chineke adịghị ata ata, 
nʼihi inye ndị mmadụ mkpụrụ ubi, 
nʼihi na ọ bụ otu a ka ị chọrọ ka ọ dịrị. 
 10 Ị na-eme ka mmiri jupụta nʼala a kọrọ akọ mee ka elu aja a kọrọ akọ dị larịị; 
ị na-eji mmiri ozuzo eme ka ọ dị nro, na-agọzikwa ihe ndị akụnyere na ya. 
 11 Ị na-eji owuwe ihe ubi bara ụba kpukwasị afọ ọbụla dịka okpueze, 
ụgbọ na-ebu ihe owuwe ubi na-ejubiga oke. 
 12 Ala ebe ahịhịa na-epu nʼọzara na-ejupụta nʼahịhịa ndụ, 
e yikwasịrị ugwu niile obi ụtọ dịka uwe. 
 13 E were igwe anụ ụlọ kpuchie nʼelu ala niile ebe ahịhịa dị ndụ puru, 
ọka kpuchikwara ndagwurugwu niile; 
ha na-eti mkpu ọṅụ na-abụkwa abụ.