Abụ Ọma 8
Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nʼusoro gittit. 
Ịdị ebube Chineke na nsọpụrụ nke mmadụ 
 1 O Onyenwe anyị Onyenwe anyị, 
lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile! 
I meela ka ebube gị dị elu 
nʼime eluigwe. 
 2 Site nʼotuto* 8:2  Mat 21:16 ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara, 
ị tọọla ntọala siri ike megide ndị iro gị, 
ka e si otu a mechie ọnụ onye iro na onye ahụ na-abọ ọbọ. 
 3 Mgbe ọbụla m lere anya na mbara eluigwe, 
hụ ọrụ niile nke aka gị rụrụ, 
mgbe m lere anya nʼelu hụ ọnwa na kpakpando 
i tinyere nʼọnọdụ ha, 
 4 gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? 
Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta† 8:4 Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ na ihe banyere ya na-emetụ gị nʼobi ha? 
I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze. 
 6 I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke, 
tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya. 
 7 Ọ na-achị igwe ewu na atụrụ, na ehi, 
na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ niile, 
 8 na nnụnụ niile, 
na azụ niile, 
na anụ ndị ọzọ na-ebi nʼime mmiri. 
 9 O Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, 
lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile. 
*Abụ Ọma 8:2 8:2 Mat 21:16
†Abụ Ọma 8:4 8:4 Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ na ihe banyere ya na-emetụ gị nʼobi
‡Abụ Ọma 8:5 8:5 Maọbụ, ya
§Abụ Ọma 8:5 8:5 Maọbụ, Chineke