Abụ Ọma 4
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ Ọma Devid nke a na-eji ụbọ akwara akpọ. 
Ntụgharị uche nke abalị 
 1 Zaa m mgbe m na-akpọku gị 
Chineke m, gị onye ezi omume; 
Napụta m site nʼihe mgbu m, 
meere m ebere, nụrụkwa ekpere m. 
 2 Unu ụmụ mmadụ, ruo ole mgbe ka unu ga-atụgharịa ebube m, mee ka ọ bụrụ ihe ihere? 
Ruo ole mgbe ka unu ga-ahụ ihe efu nʼanya na-achọ chi ndị ahụ na-abụghị chi nʼezie?* 4:2 Nke unu maara na ha bụ okwu ụgha
Sela
  3 Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị ahọpụtala ndị ezi omume nye onwe ya; 
ọ ga-egekwa ntị nʼolu m mgbe ọbụla m kpọkuru ya. 
 4 Maanụ jijiji, unu emehiekwala; 
mgbe unu nọ nʼelu ihe ndina unu; 
nọọnụ jụụ na-enyocha obi unu. 
Sela
  5 Tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi unu, 
chụkwaranụ ya aja ezi omume. 
 6 Ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ, “Onye pụrụ imere anyị ihe ọma?” 
Ma Onyenwe anyị, biko mee ka ìhè nke ihu gị mụkwasị anyị. 
 7 Were ọṅụ mejupụta obi m 
karịa mgbe mkpụrụ ubi, ya na mmanya ọhụrụ ha bara ụba nke ukwuu. 
 8 Aga m edina ala ma rahụ ụra nʼudo, 
nʼihi na ọ bụ naanị gị Onyenwe anyị, 
na-eme ka m nọrọ na-enweghị ihe egwu ọbụla.