Abụ Ọma 3
Abụ Ọma Devid. Nke o dere mgbe o si nʼihu Absalọm gbapụ ọsọ ndụ. 
Ekpere maka enyemaka 
 1 O Onyenwe anyị, ọnụọgụgụ ndị iro m dị ọtụtụ. 
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ebili imegide m. 
 2 Ọtụtụ nʼime ha na-ekwu banyere m sị, 
“Chineke agaghị azọpụta ya.” 
Sela
* 3:2 Okwu Hibru nʼusoro abụ nke a na-amaghị ihe ọ pụtara, ụfọdụ na-eche na ọ bụ okwu ntụziaka nye ndị ọbụ abụ banyere ihe ha ga-eme  3 Ma gị, Onyenwe anyị bụ ọta na-ekpuchi m; 
I na-ebuli isi m elu na-eme ka m bụrụ onye nwere nsọpụrụ. 
 4 Etikuru m Onyenwe anyị mkpu akwa, 
ọ nụkwara olu m, sitekwa nʼugwu nsọ ya za m. 
Sela
  5 Edinara m ala, hie ụra, 
ma bilikwa nʼụtụtụ nʼudo, nʼihi na Onyenwe anyị na-eche m nche. 
 6 A sịkwa na iri puku kwụrụ puku ndị iro agbaa m gburugburu, 
agaghị m atụ egwu ọbụla. 
 7 Bilie Onyenwe anyị! 
Zọpụta m Chineke m! 
Tie ndị iro m niile aka nʼagba;† 3:7  Job 16:10 
tipụkwa ndị ajọ omume eze nʼọnụ. 
 8 Nʼihi na nzọpụta na-esite nʼebe Onyenwe anyị nọ na-abịa. 
Ka ngọzị gị dịịrị ndị gị niile. 
Sela
 
*Abụ Ọma 3:2 3:2 Okwu Hibru nʼusoro abụ nke a na-amaghị ihe ọ pụtara, ụfọdụ na-eche na ọ bụ okwu ntụziaka nye ndị ọbụ abụ banyere ihe ha ga-eme
†Abụ Ọma 3:7 3:7 Job 16:10