3
Nkwusa nke Jọn omee baptizim 
 1 Nʼafọ nke iri na ise nke ọchịchị Tiberiọs Siza, mgbe Pọntiọs Pailet bụ onye na-achị Judịa, ebe Herọd bụkwa onye na-achị akụkụ Galili, ma nwanne ya nwoke bụ Filip na-achị akụkụ Iturịa na Trakona, Laisania bụkwa onye na-achị akụkụ Abilin,  2 mgbe ahụ Anas na Kaịfas bụ ndịisi nchụaja, okwu Chineke bịakwutere Jọn nwa Zekaraya nʼime ọzara.  3 Ọ gara nʼime obodo niile gbara Jọdan gburugburu na-ekwusa banyere baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie.  4 Dịka e dere ya nʼakwụkwọ Aịzaya onye amụma sị, 
“Otu onye na-eti mkpu nʼọzara na-asị, 
‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, 
meenụ ka okporoụzọ ya guzozie. 
 5 A ga-ekpoju ndagwurugwu ọbụla, 
ugwu ọbụla na ugwu nta ọbụla ka a ga-emekwa ka ọ dị ala. 
Ụzọ gbagọrọ agbagọ ka a ga-eme ka o guzozie nke ọma, 
meekwa ka ụzọ ọjọọ niile dị larịị. 
 6 Mmadụ niile ga-ahụkwa nzọpụta Chineke.’ ”* 3:6  Aịz 40:3-5 
 7 Jọn sịrị igwe mmadụ ndị na-apụta ka o mee ha baptizim sị, “Unu ụmụ ajụala! Onye dọrọ unu aka na ntị sị unu gbanarị ọnụma nke na-abịa?  8 Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu. Unu amalitekwala na-asị onwe unu, ‘Anyị nwere Ebraham dịka nna.’ Nʼihi na agwa m unu na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Ebraham ụmụ.  9 Ọ bụladị ugbu a, atụkwasịla anyụike na mgbọrọgwụ osisi, osisi ọbụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ ka a ga-egbutu tụba ya nʼime ọkụ.” 
 10 Ma igwe mmadụ ahụ jụrụ ya sị, “Gịnị ka anyị kwesiri ime?” 
 11 Ọ zara ha sị, “Onye ọbụla nwere uwe abụọ, ya nye onye ọ na-adịghị nke o nwere otu. Onye nwere nri ya meekwa otu ahụ.” 
 12 Ọ bụladị ndị ọna ụtụ bịakwara ka e mee ha baptizim. Ha sịrị ya, “Onye ozizi, gịnị ka anyị kwesiri ime?” 
 13 Ọ sịrị ha, “Unu anatala karịa otu unu kwesiri ịnata.” 
 14 Ndị agha bịakwara jụọ ya sị, “Gịnịkwa ka anyị kwesiri ime?” 
Ọ sịrị ha, “Unu ejikwala ike apụnara ndị mmadụ ego ha; unu ebokwala ndị mmadụ ebubo ụgha, ka afọ ju unu nʼụgwọ a na-akwụ unu.” 
 15 Ndị mmadụ ji olileanya na-eche na-atulekwa nʼobi ha ma Jọn ọ bụ Kraịst ahụ.  16 Ma Jọn zara sị ha, “Eji m mmiri na-eme unu baptizim, ma otu onye dị ike karịa m ga-abịa, onye m na-erughị ịtọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptizim.  17 Ihe ịfụcha ọka ya dị nʼaka ya, iji zachaa ebe ịzọcha ọka ya nke ọma, ka e kponye ezi mkpụrụ ọka wiiti nʼime ọba, ma kpoba igbugbo ọka nʼime ọkụ nke a na-apụghị imenyụ emenyụ.”  18 O ji ọtụtụ okwu ọzọ dị iche iche dụọ ha ọdụ ma kwusaakwara ha oziọma. 
 19 Ma Eze Herọd, onye ọ tara ụta maka Herodịas nwunye nwanne ya nwoke, nakwa maka ihe ọjọọ dị iche iche ndị o mere,  20 tụkwasịkwara ihe nʼelu ihe ndị a niile, site na ịtụnye Jọn nʼụlọ mkpọrọ. 
Baptizim na usoro ndị agbụrụ Jisọs 
 21 Mgbe e mechara ndị niile baptizim, ma mechakwa Jisọs baptizim, mgbe ọ na-ekpe ekpere, eluigwe meghere.  22 Mmụọ Nsọ sikwa nʼelu rịdata dị ka nduru, bekwasị ya, mgbe ahụ, otu olu sitere nʼeluigwe daa sị, “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, ihe gị dị m ezi mma.” 
 23 Jisọs agbaala ihe dị ka iri afọ atọ mgbe o bidoro ọrụ ya. Ọ bụ nwa (dịka ndị mmadụ chere) Josef, 
onye bụ nwa Heli;  24 Heli abụrụ nwa Matat, 
nwa Livayị, nwa Meliki, 
nwa Janayi, nwa Josef; 
 25 nwa Matatiyas, nwa Emọs, 
nwa Nehum, nwa Esili, 
nwa Nagayị;  26 nwa Maat, 
nwa Matatiyas, nwa Semein, 
nwa Josek, nwa Joda; 
 27 nwa Joanan, nwa Resa, 
nwa Zerubabel, nwa Shealtiel, 
nwa Neri;  28 nwa Meliki, 
nwa Adi, nwa Kosam, 
nwa Elmadam, nwa Er, 
 29 nwa Joshua, nwa Elieza, 
nwa Jorim, nwa Matat, 
nwa Livayị;  30 nwa Simiọn, 
nwa Juda, nwa Josef, 
nwa Jonam, nwa Eliakịm; 
 31 nwa Melea, nwa Mena, 
nwa Matata, nwa Netan, 
nwa Devid;  32 nwa Jesi, 
nwa Obed, nwa Boaz, 
nwa Salmọn, nwa Nashọn; 
 33 nwa Aminadab, nwa Ram,† 3:33 Nʼakwụkwọ ụfọdụ i nwere ike ihu nwa Admin, nwa Anai. 
nwa Hezrọn, nwa Perez, 
nwa Juda;  34 nwa Jekọb, 
nwa Aịzik, nwa Ebraham, 
nwa Tera, nwa Nahọ; 
 35 nwa Serug, nwa Reu, 
nwa Peleg, nwa Eba, 
nwa Shela;  36 nwa Kenan, 
nwa Aafaksad, nwa Shem, 
nwa Noa, nwa Lamek; 
 37 nwa Metusela, nwa Enọk, 
nwa Jared, nwa Mahalalel, 
nwa Kenan;  38 nwa Enọsh, 
nwa Set, nwa Adam, 
nwa Chineke.