31
 1 “Nʼoge ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya, sị, “Aga m abụ Chineke nke agbụrụ Izrel niile. Ha ga-abụkwa ndị m.” 
 2 Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, 
“Ndị ahụ gbanarịrị mma agha 
ga-ahụta ihuọma nʼọzara. 
Aga m abịa iwetara Izrel izuike.” 
 3  Onyenwe anyị mere ka anyị hụ ya anya site nʼebe dị anya, na-asị, 
“Ọ bụ ịhụnanya nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi ka m ji hụ gị nʼanya; 
Ọ bụ ebere nke na-adịghị agbanwe ka m ji dọta unu nso. 
 4 Aga m ewulikwa gị elu ọzọ, 
e, aga m eme ka ị bụrụ ihe e wugharịrị ọzọ, gị Izrel bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke. 
Mgbe ahụ, ị ga-eji ihe iti egwu gị pụọ 
soro ndị ọṅụ juru obi tee egwu. 
 5 Mgbe ahụ, ị ga-akụkwa ubi vaịnị a gbara ogige 
nʼelu ugwu Sameria. 
Ndị ọrụ ubi kụrụ ya 
ga-erikwa mkpụrụ si na ya. 
 6 Ụbọchị ahụ ga-adị mgbe ndị nche ga-anọ 
nʼelu ugwu nta niile nke Ifrem tikuo ndị niile sị ha, 
‘Bịanụ ka anyị jeruo Zayọn, 
ka anyị jee nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị.’ ” 
 7 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, 
“Tienụ mkpu ọṅụ nʼihi Jekọb, 
tienụ mkpu ọṅụ nʼihi onye ahụ kachasị mba niile nʼịdị ukwuu. 
Meenụ ka a nụrụ ya, toonu ma na-asịkwanụ, 
‘Onyenwe anyị, biko, zọpụta ndị gị, 
bụ ndị Izrel fọdụrụ.’ 
 8 Lee, aga m esite nʼala ahụ dị nʼugwu kpọta ha; 
aga m eme ka e si na nsọtụ niile nke ụwa chịkọtaa ha. 
Nʼetiti ha ka a ga-ahụ ndị kpuru ìsì na ndị ngwụrọ, 
na ndị inyom dị ime, na ndị inyom ime na-eme. 
Ndị ga-alọta ga-adị nnọọ ukwuu! 
 9 Ha ga na-akwa akwa mgbe ha na-alọta, 
ha ga-anọkwa nʼekpere mgbe m ga-edulata ha. 
Aga m edu ha site nʼakụkụ iyi, 
nʼala dị larịị, ebe ha na-agaghị akpọbi ụkwụ ha, 
nʼihi na aghọọlara m Izrel nna, 
Ifrem bụkwa ọkpara m. 
 10 “Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu mba niile; 
kwusaanụ ya nʼebe dị anya nke ala ahụ dị nʼakụkụ osimiri niile. 
Onye ahụ chụsara Izrel ga-achịkọtakwa ha. 
Ọ ga-elekọtakwa igwe ewu na atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ. 
 11 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-agbapụta Jekọb, 
ọ ga-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ka ha ike. 
 12 Ha ga-abịa nọọ nʼugwu Zayọn tie mkpu ọṅụ, 
ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị ukwu nke ezi ihe Onyenwe anyị nyere ha, 
dịka ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ, 
na ụmụ igwe ewu na atụrụ, na ọtụtụ ehi. 
Ha ga-adị ka ubi a na-agba mmiri mgbe niile; 
ha agaghị erukwa ụjụ ọzọ. 
 13 Mgbe ahụ, obi ga-atọ ụmụ agbọghọ ụtọ, ha ga-etekwa egwu ọṅụ, 
ụmụ okorobịa na ndị agadi ga-aṅụrịkwa ọṅụ. 
Aga m eme ka iru ụjụ ha ghọọrọ ha obi ụtọ, 
aga m enyekwa ha nkasiobi na ọṅụ nʼọnọdụ mwute. 
 14 Aga m emekwa ka afọ jubiga ndị nchụaja oke nʼihi ịdị ukwuu nke onyinye ha ga-enweta, 
afọ ezi ihe m ga-ejukwa ndị m,”* 31:14 Ndị m ga-enwejubigakwa ihe niile oke 
otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 
 15 Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, 
“A nụrụ otu olu na Rema, 
iru ụjụ na oke ịkwa akwa. 
Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya, 
o kwekwaghị ịnabata nkasiobi a na-akasị ya, 
nʼihi na ụmụ ya adịghịkwa.” 
 16 Ma otu a ka Onyenwe anyị kwuru, 
“Jide olu gị aka, ka ọ ghara ịkwa akwa, 
jidekwa anya gị abụọ, ka ha ghara ịgba anya mmiri, 
nʼihi na a ga-akwụ gị ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ gị.” 
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 
“Ha ga-esite nʼala ndị iro ha lọtakwa. 
 17 Nʼihi ya, olileanya dịkwara ọdịnʼihu gị.” 
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 
“Ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala nke aka ha. 
 18 “Anụla m nnọọ ịsụ ude Ifrem, na okwu o kwuru sị, 
‘Ị dọọla m aka na ntị dịka nwa ehi nke na-eme isiike. 
Lee, amụtala m ihe ị chọrọ ka m mụta site nʼịdọ aka na ntị gị. 
Ya mere, kpọlata m, ka m nwee ike lọtakwa, 
nʼihi na ị bụ Onyenwe anyị na Chineke m. 
 19 Mgbe m kpafuru, 
echegharịrị m. 
Mgbe m ghọtakwara, 
e tiri m aka nʼobi m, 
ihere mere m, ọ wutekwara m 
nʼihi nʼọnọdụ ihe ihere nʼihi ụdị ndụ m biri nʼokorobịa m.’ 
 20 Ifrem, ọ bụghị nwa m nwoke, 
onye ihe ya na-atọ m ụtọ? 
Ọ bụ ezie na m na-ekwu okwu megide ya, 
ma anọkwa m na-echeta ya. 
Nʼihi ya, ihe banyere ya na-agụsị obi m agụụ ike. 
Ana m enwekwa obi ebere nʼebe ọ nọ.” 
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 
 21 “Manyenụ ogidi ịhụba ụzọ ama, 
manyekwanụ osisi ịhụba ụzọ ama. 
Lezienụ anya mụta aha okporoụzọ niile, 
bụ okporoụzọ unu ga-eso. 
Lọta, gị Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, 
laghachi nʼobodo gị ndị a. 
 22 Ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-awagharị, 
gị nwaagbọghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi Izrel? 
Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ime ihe ọhụrụ nʼụwa; 
nwanyị ga-anọ nwoke gburugburu.” 
 23 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru, “Mgbe m si na mba ọzọ kpọghachi ha, ndị ga-ebi nʼala Juda na nʼime obodo ya niile ga-ekwu okwu ndị a ọzọ sị: ‘Onyenwe anyị gọzie gị, gị ebe obibi dị nsọ, gị ugwu dị nsọ.’  24 Ndị mmadụ ga-ebikọta ọnụ na Juda na nʼobodo niile dị nʼime ya, ma ndị na-arụ ọrụ ubi, ma ndị na-elekọta igwe ewu na atụrụ ha.  25 Aga m enwoghakwa ike ndị na-ada mba, meekwa ka afọ ju ndị ike gwụrụ.” 
 26 Nʼoge a, esi m nʼụra teta, lee anya gburugburu m. Ụra m rahụrụ tọrọ m ụtọ nke ukwuu. 
 27 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe m ga-akụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ nʼụlọ Izrel na nʼụlọ Juda.  28 Ọ ga-erukwa na dịka m legidere ha anya maka ihopu ha, ikwada ha, itikpọ ha, laa ha nʼiyi, ma mee ka ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, otu a ka m ga-esikwa lezie ha anya iwuzi ha na ịkụ ha dị ka mkpụrụ.” Ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.  29 “Nʼụbọchị ndị ahụ, ndị mmadụ agaghị asịkwa, 
“ ‘Nna anyị ha arachaala mkpụrụ osisi na-achaghị acha, 
ma lee, eze ụmụ ha na-ejiji ejiji.’ 
 30 Kama onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya; onye rachara mkpụrụ osisi na-achaghị acha ka eze ya ga-ejiji. 
 31 “Lee, oge na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, 
“mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị 
nʼetiti mụ na ụlọ Izrel, 
nakwa ụlọ Juda. 
 32 Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ 
mụ na nna nna ha gbara, 
mgbe ahụ m jidere ha nʼaka 
site nʼala Ijipt dupụta ha, 
nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m, 
ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,” 
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 
 33 “Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba 
mgbe oge ndị ahụ gasịrị,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. 
“Aga m etinye iwu m nʼime obi ha, 
aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha. 
Aga m abụ Chineke ha, 
ha onwe ha ga-abụkwa ndị m. 
 34 Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe, 
maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’ 
nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ, 
site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha.” 
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 
“Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha, 
agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.” 
 35 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, 
bụ onye ahụ họpụtara anyanwụ 
mee ka ọ na-enye ihe nʼehihie, 
onye ahụ nyere ọnwa na kpakpando iwu 
ka ha na-enye ihe nʼanyasị, 
onye na-akpali oke osimiri, 
na-eme ka ebiliri mmiri na-ebigbọ. 
Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. 
 36 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, 
“Ọ bụ naanị ma ụkpụrụ ndị a ọ pụrụ nʼihu m, ghara ịdịkwa, 
ka a ga-eme ka ụmụ ụmụ Izrel ghara ịdị, 
ka ha ghara ịbụkwa mba nʼihu m ọzọ.” 
 37 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, 
“Ọ bụ naanị mgbe e nwere ike ịtụ ma chọpụta ịsa mbara nke mbara eluigwe, 
na ịdị omimi nke ntọala ụwa, 
ka m ga-ajụ ụmụ ụmụ niile nke Izrel, 
nʼihi ihe† 31:37 Ya bụ, ihe ọjọọ niile ha mere.” 
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 
 38 “Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, mgbe a ga-ewugharị obodo a nye m, site nʼụlọ elu Hananel ruo nʼọnụ ụzọ ama Akụkụ.  39 Ịdị ogologo nke eriri ọtụtụ a ga-eji tụọ ya ga-adị ka site nʼihu ọnụ ụzọ ama ahụ ruo nʼugwu Gareb, gaakwa ruo Goa.  40 Ndagwurugwu ahụ niile ebe a tụnyere ozu ndị mmadụ, na ebe e kpofuru ntụ, na mgbada ugwu ahụ niile ebe e doziri edozi maka ịkụ ihe, ruo na ndagwurugwu iyi Kidrọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama ịnyịnya, ga-aghọkwa ebe dị nsọ nye Onyenwe anyị. A gaghị ehopukwa obodo ahụ ọzọ, maọbụ tikpọọ ya.”