23
Onyenwe anyị Ezi omume Anyị 
 1 “Ahụhụ dịrị ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-achụsasị, ma na-ebibi igwe atụrụ m ha kwesiri ilekọtazi anya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.  2 Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-agwa ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-elekọta ndị m, “Ebe ọ bụ na unu akpasasịala igwe ewu na atụrụ m, chụsaa ha, kama ilekọtazi ha anya nke ọma, aga m ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ ndị a unu mere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.  3 “Mụ onwe m ga-eji aka m chịkọta ndị m fọdụrụ nʼigwe ewu na atụrụ m site na mba ahụ niile m chụgara ha, kpọghachikwa ha nʼebe ịta nri ha, ebe ha ga-anọ mụbaa, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ.  4 Aga m ahọpụtakwa ndị ọzụzụ atụrụ, ndị ga-elekọtazi ha anya. Egwu agaghị atụ ha, ọ dịkwaghị onye ga-emenye ha ụjọ. O nwekwaghị onye ga-akpafu akpafu nʼime ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 
 5 “Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, 
“mgbe m ga-eme ka Ngalaba na-eme ezi omume bilie nʼezinaụlọ Devid. 
Ọ ga-abụ Eze ga-eji amamihe chịa ndị ya. 
Ọ ga-eme ezi ihe, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ. 
 6 Nʼụbọchị, ya ka a ga-azọpụta Juda, 
Izrel ga-ebikwa nʼudo. 
Nke a bụ aha a ga-akpọ ya: 
Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ Ezi omume Anyị.* 23:6 Onyenwe anyị, bụ ezi omume anyị. 
 7 “Nʼihi nke a, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe ndị mmadụ na-agaghị asịkwa ọzọ, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye sitere nʼala Ijipt dupụta ndị Izrel,’  8 ma ha ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọlatara agbụrụ Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba dị iche iche ebe ọ chụgara ha.’ Mgbe ahụ, ha ga-ebi nʼala nke aka ha.” 
Ndị amụma ụgha. 
 9 Ma banyere ndị amụma, 
obi m na-agbawa nʼime m, 
ọkpụkpụ m na-amakwa jijiji nʼihi ha. 
Adị m dịka nwoke mmanya na-egbu, 
dịka onye ṅụbigara mmanya oke, 
nʼihi ihe na-eche ha site nʼaka Onyenwe anyị, 
na site nʼokwu nsọ ya. 
 10 Ndị jupụtara nʼala a bụ ndị na-akwa iko. 
Nʼihi ịbụ ọnụ ndị a niile ala a tọgbọrọ nʼefu, 
ahịhịa niile dị nʼọzara akpọnwụọla. 
Ndị amụma na-agbasokwa ihe ọjọọ. 
Ha na-egosikwa ike ha nʼụzọ na-ezighị ezi. 
 11 “Nʼihi na ndị amụma na ndị nchụaja aghọọla ndị na-amaghị Chineke. 
Ọ bụladị nʼime ụlọnsọ ukwu m ka m na-ahụ ajọ omume ha.” 
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 
 12 “Nʼihi ya, ụzọ ha na-agbaso ga-adị ka ebe na-amị amị; 
a ga-achụbanye ha nʼọchịchịrị 
ebe ahụ ka ha ga-anọkwa daa. 
Aga m eme ka ihe mbibi bịakwasị ha 
nʼafọ ahụ, a ga-ata ha ahụhụ.” 
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. 
 13 “Ahụrụ m ihe arụ 
nʼetiti ndị amụma Sameria: 
Ha buru amụma site nʼike chi Baal, 
si otu a duba ndị m, bụ Izrel na mmehie. 
 14 Ahụkwara m ihe jọgburu onwe ya 
nʼetiti ndị amụma nọ na Jerusalem. 
Ha na-ebi ndụ ịkwa iko, na ikwu okwu ụgha. 
Ha na-agba ndị ajọ omume ume, 
si otu a na-egbochi ha isi nʼihe ọjọọ ha tụgharịa. 
Ha niile dịka ndị Sọdọm nʼebe m nọ; 
ndị Jerusalem dịkwa ka ndị Gọmọra nʼihu m.” 
 15 Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ndị amụma a, 
“Aga m eme ka ha rie nri na-akụ ilu, 
meekwa ka ha ṅụọ mmiri e tinyere nsi, 
nʼihi na mmụọ nke amaghị Chineke esitela nʼaka ndị amụma nọ na Jerusalem 
gbasaa ruo ndị niile bi nʼala ahụ.” 
 16 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, 
“Unu aṅala ntị nʼihe ndị amụma ahụ na-eburu unu nʼamụma, 
nʼihi na olileanya ha na-ewetara unu abụghị ezi olileanya. 
Ọhụ ha na-agwa unu na ha hụrụ bụ ihe ha chepụtara nʼobi ha, 
o sighị nʼọnụ Onyenwe anyị rute ha 
 17 Ha na-anọgide na-agwa ndị ahụ na-elelị m anya na-asị ha, 
‘Onyenwe anyị kwuru sị, unu ga-enwe udo.’ 
Ndị ahụ niile na-agbasokwa ụzọ isiike nke obi ha tụpụtara, 
ka ha na-agwakwa okwu sị, ‘O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị.’ 
 18 Ma olee onye ọ bụ nʼetiti ndị amụma a nke na-abịaru Onyenwe anyị nso, 
hụ ya anya maọbụ ịnụ ihe ọ na-ekwu? 
Onye kwa nʼetiti ha nwerela ike ṅaa ntị nụrụ okwu ya? 
 19 Lee, Onyenwe anyị na-ezite oke ifufe na-efesi ike, 
ọ bụ oke ifufe nke iwe ya, 
nke ga-abịa 
bufuo ndị ajọ omume a. 
 20  Onyenwe anyị agaghị akwụsị iwe iwe ya 
tutu ruo mgbe o mezuru 
ihe niile dị ya nʼobi. 
Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa nʼihu, 
unu ga-aghọta ihe ndị a niile nke ọma. 
 21 Ọ bụghị m zitere ndị amụma a, 
ma ha na-ekwu na ọ bụ okwu si m nʼọnụ ka ha na-ekwu. 
O nwebeghị oge m ji gwa ha okwu, 
ma ha nọkwa na-ebu amụma. 
 22 A sị na ha abịala nso guzo nʼebe ịgba izu nzuzo m, 
ha gaara ekwusara ndị m okwu m, 
nke gaara eme ka ha site nʼajọ omume ha tụgharịa, 
sitekwa nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa. 
 23 “Abụ m naanị Chineke na-anọ ha nso, 
ma adịghị m anọ nʼebe dị anya?” 
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 
 24 “O nwere onye pụrụ izo onwe ya nʼebe nzuzo 
nke m na-enweghị ike ịhụ anya?” 
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 
“Ọ bụ na m anọghị nʼebe niile nʼeluigwe nakwa nʼụwa?” 
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 
 25 “Anụla m ka ndị amụma a, bụ ndị na-ebu amụma ụgha nʼaha m na-ekwu na-asị, ‘Arọrọ m nrọ! Arọrọ m nrọ!’  26 Ruo ole mgbe ka ihe dị otu a ga-adịgide nʼobi ndị amụma ndị a, ndị na-ebu amụma aghụghọ dị ha nʼobi?  27 Ha na-eche na nrọ ha na-akọrịtara ibe ha ga-eme ka ndị mmadụ chezọọ aha m, dịka ndị nna nna ha si chezọọ aha m site nʼịkpọ isiala nye Baal.  28 Ka onye amụma ahụ rọrọ nrọ kọgharịa nro ọ rọrọ. Otu a kwa, ka onye ahụ okwu m dị nʼọnụ ya nọgidekwa na-ekwusa ya nʼeziokwu. Nʼihi na gịnị ka okporo ọka na mkpụrụ ọka nwekọrọ?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.  29 “Okwu m ọ dịghị ka ọkụ? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,† 23:29 Maọbụ, na-ajụ ajụjụ sị Okwu m ọ dịkwaghị ka okporo igwe‡ 23:29 Lit. Hama nke na-etiwasị nkume?” 
 30 Nʼihi ya, Onyenwe anyị kwubiri sị, “Ana m edo onwe m megide ndị amụma na-esite nʼọnụ ibe ha na-ezute okwu ha na-ekwu, ma na-asị na ọ bụ nʼọnụ m ka ha si nata ya.  31 E, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, Ana m edo onwe m megide ndị amụma ahụ ire ha na-ekwu ọtụtụ okwu, ndị ahụ na-asịkwa, ‘Ọ bụ ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.’  32 Nʼezie, ana m edo onwe m megide ndị ahụ niile na-ebu amụma nro ụgha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ha ji okwu ụgha ha na-agwa ndị m okwu, na-eduhie ha, ma ọ bụghị m họpụtara ha. Ọ bụkwaghị m zitere ha. Okwu ha adịghịkwa abara ndị m uru ọbụla.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. 
Ndị amụma ụgha na ịjụ ase ụgha. 
 33 “Mgbe ndị a, maọbụ ndị amụma ha, maọbụ ndị nchụaja ha, jụrụ gị ajụjụ sị gị, ‘Gịnị bụ ozi i si nʼọnụ Onyenwe anyị nata?’ Ị ga-asa ha sị, ‘Ozi nke ole?§ 23:33 Akwụkwọ ụfọdụ na-asị, unu onwe unu bụ isi okwu ya Aga m agbakụta unu azụ, ya bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri.’  34 Ọ bụrụ na onye amụma maọbụ onye nchụaja maọbụ onye ọbụla ọzọ ekwuo sị, ‘Ihe dị otu a bụ ozi* 23:34 Maọbụ, okwu si nʼọnụ Onyenwe anyị,’ aga m ata onye ahụ kwuru okwu ahụ na ndị ezinaụlọ ya ahụhụ.  35 Ihe ndị a bụ ihe unu na-agwarịta onwe unu nʼotu nʼotu. Ọ bụ ihe enyi na-agwa enyi ya, na ihe nwanna na-agwa nwanna Izrel ibe ya. Unu na-asị, ‘Gịnị bụ ọsịsa Onyenwe anyị nyere?’ maọbụ, ‘Gịnị bụ okwu e si nʼọnụ Onyenwe anyị nata?’  36 Kwụsịnụ ịjụgharị ajụjụ banyere ihe Onyenwe anyị kwuru, nʼihi na okwu onye ọbụla nʼime unu kwuru na-aghọrọ onye ahụ ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta. Site nʼụzọ dị otu a unu na-agbanwe ma na-asụgharịkwa okwu Chineke dị ndụ isi, bụ okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke anyị.  37 Ihe ndị a niile bụ ihe unu na-ajụkarị onye amụma, ‘Gịnị bụ ọsịsa Onyenwe anyị nyere gị? Maọbụ, gịnị ka Onyenwe anyị kwuru?’  38 Ọ bụ ezie na unu na-ekwu sị, ‘Ihe ndị a bụ ozi si nʼaka Onyenwe anyị,’ ma lee ihe Onyenwe anyị na-ekwu: Unu na-ekwu okwu ndị a, ‘Ihe a bụ ozi si nʼaka Onyenwe anyị,’ ọ bụladị mgbe m gwarala unu si unu asịkwala ‘Ihe ndị a bụ ozi nʼaka Onyenwe anyị.’  39 Ya mere, mụ onwe m ga-echezo unu kpamkpam ma sitekwa nʼihu m chụpụ unu na obodo a nke m nyere unu na nna nna unu ha.  40 Aga m eme ka ịta ụta ebighị ebi bịakwasị unu. Aga m etinyekwa unu nʼọnọdụ ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi, e, ọnọdụ ihere nke a na-agaghị echefu echefu.”