22
Ikpe ọmụma dịrị ndị eze ọjọọ 
 1 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Jee nʼụlọeze Juda nọdụ nʼebe ahụ kwusaa ozi ndị a.  2 ‘Nụrụ okwu Onyenwe anyị, nye gị, gị eze Juda, gị onye na-anọkwasị nʼocheeze Devid. Nụrụ ya, gị na ndịisi ọchịchị gị, na unu ndị niile na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụ na-abatakwa.  3 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Meenụ ihe dị mma na ihe ziri ezi. Napụtanụ onye eji aka ike napụ ihe o nwere site nʼaka onye ahụ na-emegbu ya. Unu emejọkwala onye ọbịa, maọbụ mee ya ihe ike. Unu emekwala ndị na-enweghị nna, maọbụ ndị inyom di ha nwụrụ ihe ọjọọ. Unu awụsịkwala ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼebe a.  4 Nʼihi na ọ bụrụ na unu elezie anya mee iwu ndị a niile, mgbe ahụ, ndị eze na-anọkwasị nʼelu ocheeze Devid ga-anọgide na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụta, na-abata nʼelu ụgbọ agha ha, ma nʼelu ịnyịnya ha, ha na ndịisi ọchịchị ha, na ndị ha na-achị.  5 Ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu ndị a, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, eji m onwe m na-aṅụ iyi na ụlọeze a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe.’ ” 
 6 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere ụlọeze Juda, 
“Ọ bụ ezie na ịdị dịka Gilead nye m, 
dịka elu ugwu ukwu Lebanọn, 
aghaghị m ime gị ka ị dịrị ka ebe ikpofu ahịhịa, 
dịka obodo ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya. 
 7 Aga m ezite ndị mbibi ndị ga-abịa megide gị. 
Onye ọbụla nʼime ha ga-eji ngwa agha ya. 
Ha ga-egbutusịkwa osisi sida ọma gị niile, 
tụnye ha niile nʼime ọkụ. 
 8 “Ọtụtụ ndị si mba ọzọ bịa ga-agafe obodo a. Ha ga-ajụrịta ibe ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee obodo ukwuu a ihe ọjọọ dị otu a?’  9 Ọsịsa ha ga-enweta ga-abụ, ‘Ọ bụ nʼihi na ha gbakụtara ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke ha azụ, malite ịkpọ isiala na ife chi ndị ọzọ.’ ” 
 10 Unu akwala akwa nʼihi eze ahụ nwụrụ anwụ, maọbụ ruo ụjụ nʼihi na ọ gaghị abụkwa eze unu, 
kama kwaanụ akwa nʼihi onye ahụ a dọtara nʼagha buru gaa mba ọzọ. 
Nʼihi na ọ gaghị alọghachi ọzọ; 
ọ gaghị ahụkwa ala ebe a mụrụ ya anya ọzọ. 
 11 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Shalum nwa Josaya, onye nọchiri anya nna ya dịka eze Juda, bụ onye ahụ e si nʼebe a buru gaa mba ọzọ, “Ọ gaghị alọtakwa ọzọ.  12 Ebe ahụ e buuru ya gaa ka ọ ga-anọ nwụọ. Ọ gaghị ahụkwa ala nke aka ya anya ọzọ.” 
 13 “Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọeze ya site nʼụzọ ajọ omume, 
nke jikwa ikpe na-ezighị ezi na-ewu ime ụlọ elu ya niile, 
onye ahụ nke na-eme ndị mmadụ rụọ ọrụ nʼefu, 
nke na-adịghị akwụ ha ụgwọ ọbụla nʼihi ọrụ ha. 
 14 Onye na-asị, ‘Aga m ewuru onwe m ụlọeze buru ibu, 
nke ọnụụlọ dị nʼụlọ elu ya sara ezi mbara.’ 
Ya mere, ọ tinyere oghereikuku sara mbara nʼụlọ ahụ, 
jirikwa osisi sida machie elu ya, 
werekwa penti* 22:14 Ya bụ, mgba na-acha uhie uhie chọọ ya mma. 
 15 “Ị ga-abụ eze 
nʼihi na i nwere ọtụtụ osisi sida karịa ndị ọzọ? 
Nna gị o nweghị ihe oriri na ihe ọṅụṅụ? 
O mere ihe dị mma na ihe ziri ezi 
nʼihi ya ihe niile gaara ya nke ọma. 
 16 O kwuchitere ọnụ ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa, 
nke a mere na ihe niile gara nke ọma. 
Ọ bụghị nke a bụ ihe ọ pụtara bụ ịmara m? 
Ka Onyenwe anyị kwupụtara 
 17 Ma anya unu na obi unu 
adịghị nʼihe ọzọ ma ọ bụghị naanị nʼuru nʼezighị ezi 
nʼiwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha, 
na imegbu ndị mmadụ, na iji aka ike pụnara ha ihe ha nwere.” 
 18 Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Jehoiakim nwa Josaya eze Juda: 
“Ha agaghị eruru ya uju sị, 
‘Ewoo nwanne m nwoke! Ewoo nwanne m nwanyị!’ 
Ha agaghị eruru ya uju sị, 
‘Ewoo nna anyị ukwu! Ewoo ịma mma ya!’ 
 19 A ga-eli ya dịka e si eli ịnyịnya ibu. 
A ga-adọkpụrụ ozu ya nʼala tufuo ya 
nʼazụ ọnụ ụzọ ama Jerusalem.” 
 20 “Gbagoruo na Lebanọn tie mkpu akwa, 
meenụ ka a nụ olu unu na Bashan, 
sitekwanụ na Abarim tie mkpu akwa 
nʼihi na e gweriela ndị niile unu na ha dị na mma. 
 21 Adọrọ m gị aka na ntị nʼoge ahụ ị nọ na-eche na i guzo chịm, 
ma ị jụrụ ige ntị. 
Nke a bụkwa omume gị site na mgbe ị bụ nwantakịrị. 
Ị jụkwara irubere m isi. 
 22 Oke ifufe ga-ebufu ndị ọzụzụ atụrụ gị niile, 
a ga-emekwa ka ndị gị na ha dị na mma gaa biri na mba ọzọ. 
Mgbe ahụ, ihere ga-eme gị, ị ga-aghọkwa onye e wedara nʼala 
nʼihi ajọ omume gị niile. 
 23 Gị onye na-ebi na Lebanọn,† 22:23 Nke a bụ ụlọeze ahụ dị na Jerusalem, hụ nke a na 1Ez 7:2 
onye ebe obibi ya dị nʼụlọ e ji osisi sida wuo, 
lee ka i si‡ 22:23 Akwụkwọ ndị ọzọ ga-ede; lee ka ị si bụrụ onye a ga-emere ebere mgbe ihe mgbu na-asụ ude mgbe ihe mgbu bịakwasịrị gị, 
ihe mgbu yiri nke nwanyị ime na-eme. 
 24 “Ma dịka m na-adị ndụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “a sịkwarị na gị, bụ Jehoiakin, nwa Jehoiakim eze Juda, bụ mgbaaka akara m gbanyere na mkpịsịaka dị nʼaka nri m, aga m agbapụkwa gị,  25 were gị nyefee nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ gị ike, bụ ndị ahụ ị na-atụ ụjọ ha. Aga m enyefe gị nʼaka Nebukadneza eze Babilọn na ndị Kaldịa.  26 Aga m atụfu gị na nne mụrụ gị, tụga unu na mba ọzọ dị iche site nʼobodo a nọ mụọ unu. Ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ.  27 Unu agaghị alọghachikwa nʼala ahụ na-agụ unu agụụ ịlọghachi nʼime ya.” 
 28 Nwoke a bụ Jehoiakin, ọ bụ ite tiwara etiwa, nke e lelịrị elelị, 
ihe onye ọbụla na-achọghị? 
Nʼihi gịnị ka a ga-eji tufuo ya na ụmụ ya, 
tụga ha na mba ha na-amaghị? 
 29 Ala, ala, ala, 
nụrụ okwu Onyenwe anyị. 
 30 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru: 
“Detuo ya nʼakwụkwọ na nwoke a bụ onye gba aka nwa, 
nwoke nke ihe na-agaghị agara nke ọma nʼoge ndụ ya niile, 
nʼihi na o nweghị onye nʼime ụmụ ọ mụrụ nke ihe ga-agara nke ọma, 
o nwekwaghị onye nʼime ha ga-anọkwasị nʼocheeze Devid, 
maọbụ chịakwa ọzọ na Juda.”