12
 1 Akaọrụ Ifrem bụ naanị ịchụso ikuku, 
ọ na-achụso ikuku si nʼọwụwa anyanwụ bido nʼụtụtụ ruo nʼabalị. 
Otu a ka ha si eme ka ịgha ụgha, na ime ihe ike na-abawanye ụba. 
Ha na Asịrịa na-agbakwa ndụ, 
ha na-ebugakwa mmanụ nʼIjipt. 
 2  Onyenwe anyị na-akpọ Juda ikpe. 
Ọ ga-ata Jekọb* 12:2 Jekọb nʼebe a bụ akpalaokwu nke pụtara onye aghụghọ Maọbụ, onye na-aghọrị mmadụ ahụhụ dịka ụzọ ya si dị, 
kwụghachikwa ya dịka omume ya si dị. 
 3 Mgbe ọ nọ nʼafọ nne ya ka o jidere nwanne ya nwoke nʼikiri ụkwụ. 
Mgbe ọ ghọrọ dimkpa, ya na Chineke gbara mgba. 
 4 E, ya na mmụọ ozi gbara mgba. 
Nʼoge ahụ, o jidesiri ya aka ike, kwaa akwa, rịọọ ngọzị site nʼaka ya. 
Ọ hụrụ ya na Betel, 
gwaakwa ya okwu, 
 5  Onyenwe anyị Chineke onye pụrụ ime ihe niile, 
Onyenwe anyị bụ aha ya. 
 6 Ịghaghị ịlọghachikwute Chineke gị, 
guzosie ike nʼịhụnanya na ikpe ziri ezi, 
na-elekwa anya Chineke gị mgbe niile. 
 7 Onye ahịa na-eji ihe ọtụtụ aghụghọ na-erenye ndị mmadụ ahịa, 
ọ hụrụ imegbu emegbu nʼanya. 
 8 Ifrem kwuru, 
“Abaala m ọgaranya! Abụrụla m onye nwere akụnụba dị ukwuu! 
Ọ bụ ezie na m bụ onye nwere akụ dị ukwuu, 
ma agaghị achọta njehie maọbụ mmehie ọbụla nʼime m.” 
 9 “Abụ m Onyenwe anyị na Chineke gị, 
onye si nʼIjipt kpọpụta unu. 
Aga m emekwa ka ị biri nʼụlọ ikwu ọzọ, 
dịka ọ dị nʼoge mmemme ndị ahụ niile a kara aka. 
 10 A gwara m ndị amụma, 
ọ bụ m mere ka ha hụ ọhụ dị iche iche, 
sitekwa nʼọnụ ndị amụma tụọ ilu dị iche iche.” 
 11 Gilead ọ na-eme ajọ ihe? 
Ndị ya bụ ndị efulefu. 
Ha na-achụ aja oke ehi dị iche iche na Gilgal? 
Ebe ịchụ aja ha niile ga a dịka ebe a chịkọtara ukwu nkume, 
nke dị nʼubi a kọrọ akọ. 
 12 Jekọb gbalagara nʼala Aram; 
Izrel fere ofufe nʼihi inweta nwunye, 
nʼihi ịkwụ ụgwọ ya, o lekọtara atụrụ. 
 13 Ọ bụkwa onye amụma ka Onyenwe anyị ji site nʼIjipt kpọpụta Izrel, 
o sitekwara nʼaka onye amụma lekọtazie ya anya. 
 14 Ma Ifrem akpasuola iwe ilu nke ukwuu. 
Onyenwe ya ga-awụkwasịkwa ya ikpe ọmụma. 
Ọ ga-akwụghachi ya dịka nlelị ya si dị.