9
Ntaramahụhụ dịrị Izrel 
 1 Aṅụrịla ọṅụ, gị Izrel, 
ka obi ghara ịtọkwa gị ụtọ dịka ọ na-atọ ndị mba ọzọ, 
nʼihi na ị jụla Chineke gị, bido ịgba akwụna 
i hụrụ ụgwọ ọrụ ịkwa iko nʼanya 
nʼelu ebe ịzọcha ọka niile. 
 2 Ebe ịzọcha mkpụrụ ọka na ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị agaghị azụ ha nri, 
mmanya ọhụrụ ga-agharịpụ ha. 
 3 Ha agaghị anọgidekwa nʼala Onyenwe anyị, 
ma Ifrem ga-alaghachi nʼala Ijipt 
nọdụ nʼAsịrịa rie nri rụrụ arụ. 
 4 Ha agaghị awụsa ihe ọṅụṅụ dịka aja nye Onyenwe anyị, 
nʼihi na ọdịghị aja ha ga-achụ ga-atọ ya ụtọ. 
Aja ndị a ga-adị ha ka nri nke ndị na-eru ụjụ si dị. 
Onye ọbụla riri nri ndị a ga-abụ onye na-adịghị ọcha. 
Nri ndị a ga-adịrị naanị ha onwe ha, 
ha agaghị ewebata ya nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 
 5 Gịnị ọzọ ka unu ga-eme nʼụbọchị mmemme unu ndị ahụ a kara aka, 
ma nʼụbọchị mmemme nke Onyenwe anyị? 
 6 A sịkwa na ha agbanarị mbibi, 
ndị Ijipt ga-achịkọta ha. 
Ndị Memfis ga-elikwa ha. 
Akụnụba nke ọlaọcha ha ka uke ga-ewekọrọ, 
ogwu na uke ga-etokwa nʼime ebe obibi ha niile, 
 7 Ụbọchị niile nke ntaramahụhụ* 9:7 Maọbụ, nleta na-abịa, 
Ụbọchị ngụkọta ihe abịala nso. 
Ka Izrel mara nke a. 
Nʼihi na ịba ụba nke mmehie unu adịla ukwuu, 
nʼihi na ịkpọ asị unu akarịala, 
unu na-agụ onye amụma dịka onye nzuzu, 
na-agụkwa onye nwee Mmụọ nke Chineke dịka onye na-ayị ara. 
 8 Ma onye amụma bụ onye nche Chineke, 
na-eche Ifrem nche, 
ma igbudu nke ọnya jupụtara nʼụzọ ya niile, 
ịkpọ asị dịkwa nʼime nʼụlọnsọ Chineke ya. 
 9 Ha emerụọla onwe ha ebe ọ dị ukwuu, 
dịka ọ dị nʼụbọchị Gibea. 
Ọ ga-echeta njehie ha. 
Ọ ga-enye ha ntaramahụhụ nʼihi mmehie ha niile. 
 10 “Mgbe m chọtara Izrel, 
ọ dị ka m chọtara mkpụrụ grepu nʼọzara; 
mgbe m hụrụ nna nna unu ha, 
ọ dị ka ihu mkpụrụ bụ ụzọ chaa nʼelu osisi fiig. 
Ma mgbe ha bịaruru na Baal-Peoa, 
ha doro onwe ha nsọ nyefee nʼaka arụsị ahụ na-eweta ihere, 
si otu a ghọọ ndị rụrụ arụ, dịka ihe ndị ahụ ha hụrụ nʼanya si bụrụ ihe rụrụ arụ. 
 11 Nsọpụrụ Ifrem nwere ga-efefu dị ka nnụnụ, 
nʼihi na ọmụmụ nwa agaghị adị, a gaghị atụkwa ime, agaghị adịkwa ime. 
 12 A sịkwa na ha azụlite ụmụ ha, 
aghaghị m ime ka ha nwụọ. 
Ahụhụ ga-adịrị ha, 
mgbe m si nʼebe ha nọ wezuga onwe m. 
 13 Ahụla m na Ifrem yiri Taịa, 
bụ ihe akụnyere nʼala mara mma. 
Ma Ifrem ga-eji aka ya 
kpọpụta ụmụ ya nye ndị ga-egbu ha.” 
 14 Biko, Onyenwe anyị nye ha. 
Gịnị ka i kwesiri inye ha? 
Nye ha akpanwa nke nwa na-adịghị anọgide nʼime ya, 
na ara nke mmiri ara na-adịghị. 
 15 “Ihe ọjọọ ha niile bidoro na Gilgal, 
akpọrọ m ha asị nʼebe ahụ. 
Nʼihi omume mmehie ha niile, 
aghaghị m isite nʼụlọ m chụpụ ha. 
Agaghị m ahụkwa ha nʼanya ọzọ, 
ndị ndu ha niile bụ ndị nnupu isi. 
 16 Etigbuola Ifrem, 
mgbọrọgwụ ha akpọnwụọla, 
ha agaghị amịkwa mkpụrụ. 
A sịkwarị na ha amụọ ụmụ, 
aga m egbu ụmụ ha niile, ndị ha hụrụ nʼanya.” 
 17 Chineke m ga-ajụ ha, 
nʼihi na ha adịghị ege ya ntị maọbụ rube isi. 
Ha ga-aghọ ndị na-awagharị awagharị na-enweghị ụlọ, nʼetiti mba niile.