8
Ụgwọ ọrụ mmehie 
 1 “Tinye opi ike nʼọnụ gị! 
Nʼihi na ugo nʼefefe nʼelu ụlọ Onyenwe anyị, 
nʼihi na ha emebiela ọgbụgba ndụ m, 
nupu isi megide iwu m. 
 2 Ugbu a ndị Izrel na-etiku m mkpu akwa, 
‘Chineke anyị, anyị bụ Izrel maara gị.’ 
 3 Ma Izrel ajụla ihe dị mma. 
Ugbu a, ndị iro ga-achụ ya ọsọ. 
 4 Ha meere onwe ha ndị eze, ma ha ajụtaghị m ase; 
ha na-achọrọkwa ndị ọchịchị,* 8:4 Ya bụ, ụmụ eze ma ghara ịjụta ase nʼaka m. 
Ọlaọcha na ọlaedo ha 
ka ha ji na-akpụrụ onwe ha arụsị, 
nke ha ji ebibi onwe ha. 
 5 Ajụla m arụsị nwa ehi a ị kpụrụ, O Sameria. 
Nʼihi na ọnụma m na-ere ọkụ megide ha. 
Ruo olee mgbe ka ha ga-anọ bụrụ ndị na-enweghị ike ịdị ọcha? 
 6 Ọ bụ nʼIzrel ka ha si. 
Ọ bụ onye na-akpụ ụzụ kpụrụ ya; 
ọ bụghị Chineke. 
A ga-akụrisikwa 
nwa ehi Sameria ahụ. 
 7 “Ha akụọla ifufe, 
ha ga-aghọtakwa oke ifufe. 
Osisi ọka ha na-eguzo 
na-enweghị okpo ọka ọbụla. 
A sịkwarị na ọ mịrị mkpụrụ, 
ndị mba ọzọ ga-atapịa ya. 
 8 Elodala Izrel! 
Lee, ha nọ ugbu a nʼetiti ndị mba ọzọ 
dịka mkpọkọrọ ite. 
 9 Nʼihi na ha ejeela Asịrịa 
dịka ịnyịnya ibu ọhịa na-awagharị naanị ya. 
Ifrem ewerela onwe ya resi ndị enyi ya. 
 10 Ọ bụ ezie na ha ewerela onwe ha resi ọtụtụ mba dị iche iche, 
aga m achịkọta ha. 
Ha ga-atakwa ahụ 
nʼihi ọnọdụ mmegbu nke eze na ndịisi ga-achị ha. 
 11 “Nʼihi na Ifrem ewuola ọtụtụ ebe nchụaja maka ịchụ aja mmehie, 
ebe nchụaja ndị a abụrụla ebe a na-eme mmehie. 
 12 E depụtaara m ha ọtụtụ ihe banyere iwu m, 
ma ha were ya dịka ihe e si na mba ọzọ webata. 
 13 Ha na-achụ aja dịka onyinye nye m, 
ha na-erikwa anụ ndị ahụ ha jiri chụọ aja, 
ma na Onyenwe anyị enweghị mmasị nʼebe aja ha dị. 
Ugbu a, ọ ga-echeta ajọ omume ha, 
nye ha ntaramahụhụ nʼihi mmehie niile ha, 
ha ga-alaghachi nʼIjipt. 
 14 Izrel echezọọla Onye kere ha 
ma wukwaa obi ndị eze dị iche iche. 
Juda ewukwaala obodo dị iche iche e wusiri ike. 
Nʼihi ya, aga m ezite ọkụ nʼobodo ha niile, 
ọkụ ga-erepịa obodo ha niile e wusiri ike.”