5
Ikpe ọmụma megide Izrel 
 1 “Nụrụnụ nke a, unu ndị nchụaja! 
Geenụ ntị, unu ụlọ Izrel! 
Geenụ ntị, unu ndị ezinaụlọ eze. 
Nʼihi na ọ bụ unu ka ikpe ahụ gbasara. 
Nʼihi na unu abụrụla ihe ị maa nʼọnya na Mizpa, 
na ụgbụ agbasara nʼelu Taboa. 
 2 Ndị nnupu isi ahụ abamiela ime nʼigbu mmadụ, 
aga m ata ha niile ahụhụ. 
 3 Amaara m ihe niile gbasara Ifrem, 
ọ dịkwaghị ihe zoro ezo banyere Izrel nʼebe m nọ. 
Gị Ifrem, ugbu a ị gbawala akwụna; 
gị Izrel, emerụọkwala gị. 
 4 “Omume ha agaghị ekwe 
ka ha laghachikwute Chineke ha, 
nʼihi na mmụọ nke ịkwa iko ewerela ute biri nʼime ha, 
ha amaghịkwa Onyenwe anyị. 
 5 Mpako niile nke Izrel na-agba ama megide ha, 
Ọ bụladị Izrel na Ifrem na-asọ ngọngọ nʼime mmehie ha, 
Juda, nʼonwe ya, soo ha na-asọ ngọngọ. 
 6 Mgbe ha ga-eji igwe ewu na atụrụ ha na igwe ehi ha, 
gaa ịchọ Onyenwe anyị, 
ha agaghị achọta ya. 
Nʼihi na o sitela nʼebe ha nọ wezuga onwe ya. 
 7 Ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị. 
Ha mụrụ ụmụ a kwatara nʼiko. 
Ugbu a, mmemme ọnwa ọhụrụ ha 
ga-eripịa ha na ala ubi ha. 
 8 “Fụọ opi ike na Gibea, 
fụkwaa mpi anụ na Rema. 
Tie mkpu agha na Bet-Aven. 
Lee anya nʼazụ gị, Benjamin. 
 9 A ga-ebibi Ifrem kpamkpam 
nʼụbọchị ahụ m ga-ata ha ahụhụ.* 5:9 Maọbụ, nʼụbọchị ntaramahụhụ 
Nʼetiti ebo nke Izrel niile, 
ka m na-ekwusa ka amara na ọ bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi.† 5:9 Ya bụ, okwu nʼaghaghị imezu 
 10 Ndị ndu Juda adịla ka ndị ahụ 
na-ewezuga oke ala, 
aga m awụkwasị ha iwe m 
dịka uju mmiri ozuzo. 
 11 Ifrem bụ onye a na-emegbu emegbu, 
onye e ji ike na-azọpịa, 
nʼihi na ọ kpacha anya na-achụso ihe efu. 
 12 Adị m ka nla nye Ifrem, 
dịkwa ka ihe na-eweta ire ure dịịrị ndị Juda. 
 13 “Mgbe Ifrem hụrụ ụdị ọrịa ọ na-arịa, 
Juda ahụkwa ọnya dị ya nʼahụ, 
mgbe ahụ Ifrem gakwuru ndị Asịrịa, 
ma zigakwara eze ukwu ahụ ozi. 
Ma ọ pụghị ịgwọ gị, 
maọbụ gwọọ ọnya gị niile. 
 14 Nʼihi na-aga m adị ka ọdụm nye Ifrem 
dịkwa ka nwa ọdụm nye Juda. 
Aga m adọkasị anụ ahụ ha ma hapụ ha pụọ. 
Aga m ebupụ ha pụọ, na-enweghị onye ga-abịa ịzọpụta ha. 
 15 Aga m alaghachi azụ nʼọnọdụ m, 
ruo mgbe ha kweere na ikpe mara ha, 
ma chọọ ihu m; 
nʼọnọdụ mmekpa ahụ ha, 
ha ga-achọsi m ike.”