8
Onyeisi nchụaja nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ 
 1 Isi okwu dị nʼihe niile anyị na-ekwu bụ nke a, na anyị nwere onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye na-anọdụ ala nʼaka nri nke ocheeze onye ahụ kachasị ihe niile elu nʼeluigwe.  2 Onye na-eje ozi nʼebe nsọ ahụ, bụ ezi ụlọ ikwu ahụ Onyenwe anyị ji aka ya wuo, ọ bụghị mmadụ wuru ya. 
 3 A họpụtara onyeisi nchụaja ọbụla ka ọ na-achụ aja na-enyekwa onyinye. Nʼihi nke a, o kwesikwara ka ọ nwee ihe ọ ga-eji na-achụ aja.  4 A sịkwarị na ọ nọ nʼụwa, o garaghị a bụ onye nchụaja nʼihi na e nwere ndị nchụaja na-achụ aja dị ka usoro iwu si dị.  5 Ha na-eje ozi nʼebe nsọ ahụ nke bụ oyiyi na onyinyo banyere ihe nke dị nʼeluigwe. Ọ bụ nke a mere e ji dọọ Mosis aka na ntị mgbe ọ na-akwado iwu ụlọ ikwu ahụ, “Lezie anya hụ na i mere ihe niile nʼusoro dị ka e si gosiri gị nʼelu ugwu.”* 8:5  Ọpụ 25:40  6 Ma otu ọ dị, ọ natara ọrụ ije ozi karịrị nke ha, dị ka onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ dị elu karịa nke ochie, ebe ọgbụgba ndụ nke ọhụrụ a o mere ka ọ dịrị nʼetiti ya na mmadụ dabeere na nkwa dị mma karịa. 
 7 Ọ bụrụ na ọgbụgba ndụ ochie ahụ zuruoke, ọ garaghị aba uru ka achọwa ọgbụgba ndụ ọzọ.  8 Ma Chineke chọpụtara ezughị oke ha mgbe ọ sịrị, 
“Lee, oge na-abịa, ka Onyenwe anyị kwupụtara, 
mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ 
dịrị nʼetiti mụ na ụlọ Izrel, 
nakwa ụlọ Juda. 
 9 Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ 
mụ na nna nna ha gbara, 
mgbe m jidere ha nʼaka 
site nʼala Ijipt dupụta ha, 
nʼihi na ha anọgideghị bụrụ ndị kwesiri ntụkwasị obi idebe ọgbụgba ndụ m. 
Nʼihi ya, echepụrụ ihu m nʼebe ha nọ, 
ka Onyenwe anyị kwupụtara. 
 10 Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ m ga-eme ka ọ dịrị nʼetiti mụ onwe m na ụlọ Izrel, 
mgbe oge ndị ahụ gasịrị, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. 
Aga m etinye iwu m nʼime uche ha, 
dekwasị ya nʼobi ha. 
Aga m abụ Chineke ha, 
ha onwe ha ga-abụkwa ndị m. 
 11 Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe, 
maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’ 
nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ, 
site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu. 
 12 Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha, 
agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”† 8:12  Jer 31:31-34 
 13 Mgbe o kwuru okwu banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ọ pụtara na nke ochie ahụ abụrụla ihe gabigara agabiga. Ihe dị ochie nke gabigara ga-emesịa ghara ịdịkwa.