24
Izrel dịka ite e sikwasịrị nʼọkụ 
 1 O ruo nʼafọ nke itoolu, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,  2 “Nwa nke mmadụ, detuo ụbọchị taa nʼakwụkwọ, nʼihi na ọ bụ taa ka eze Babilọn gbara Jerusalem gburugburu.  3 Ugbu a, tụọrọ ndị a na-enupu isi ilu a, gwa ha: ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: 
“ ‘Sikwasịnụ ite ahụ nʼọkụ; sikwasị ya 
kunyekwanụ mmiri nʼime ya. 
 4 Tinyenụ anụ a bọrọ abọ nʼime ya. 
Tinye anụ dị mma, apata ya na aka ya. 
Tinyekwa ọkpụkpụ ndị ahụ dị mma nʼime ya. 
 5 Werenụ naanị ndị kachasị mma na ndị ahọpụtara site nʼigwe ewu na atụrụ, 
kwajuokwa nkụ nʼokpuru ya maka ọkpụkpụ ndị ahụ, 
mee ya ka ọ gbọọ nke ọma, 
sie ọkpụkpụ ndị ahụ nʼime ya. 
 6 “ ‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, 
“ ‘Ahụhụ dịrị obodo ahụ a na-awụsi ọbara nʼime ya. 
E, ahụhụ dịrị ite ahụ nchara dị nʼime ya, 
nke a na-apụghị ịsachapụ nchara ya. 
Wepụtasịanụ ha nʼotu nʼotu. 
Ka a hapụ ifekwa nza mgbe a na-eme nke a. 
 7 “ ‘Nʼihi na ọbara ọ wụsiri dị nʼetiti ya. 
Ọ bụkwa nʼelu nkume ka a wụsiri ya. 
Ọ bụghị nʼelu ala efu, 
ebe e nwere ike jiri aja kpochie ya. 
 8 Ọ bụ nʼihi ikpali ọnụma na ịbọ ọbọ 
ka m ji hapụ ọbara ahụ nʼelu nkume, 
ebe a na-apụghị iji aja kpochie ya. 
 9 “ ‘Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, 
“ ‘Ahụhụ dịrị gị obodo ahụ na-awụsi ọbara. 
Mụ onwe m ga-akwanyekwa nkụ dị ukwuu nʼọkụ. 
 10 Chịkọtaanụ nkụ dị ukwuu, 
mụnyekwanụ ọkụ. 
Jirinụ ụda dị iche iche 
sizie anụ ahụ nke ọma; 
surekwaanụ ọkpụkpụ ya ọkụ. 
 11 Sinyekwanụ ite ahụ ihe na-adịghị nʼime ya nʼọkụ, 
tutu ruo mgbe ọ nụrụ ọkụ, chagharịa, 
gbazee ihe niile na-abụghị ọla dị nʼime ya ga-asọpụtasị, 
nchara ya ga-agwụsịkwa. 
 12 Ndọgbu nʼọrụ niile a emeghị ka nchara ahụ pụọ. 
Ọ bụladị ọkụ dị ukwuu ahụ a kwanyere nʼokpuru ya 
emeghị ka ọ gbazee. 
 13 “ ‘Ugbu a, adịghị ọcha gị sitere na ndụ ọjọọ nke ịkwa iko gị. Nʼihi na m agbalịala ime ka ị dị ọcha, ma i kweghị adị ọcha site na mmerụ gị, ị gaghị adịkwa ọcha ọzọ tutu ruo mgbe ọnụma m megide gị zuruoke. 
 14 “ ‘Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Oge m ji emezu ihe m kwuru eruola. Agaghị m ahapụ imezu ya. Agaghị m eme ebere maọbụ weghachi aka m azụ. A ga-ekpe gị ikpe dịka omume na obibi ndụ gị si dị. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’ ” 
Ọnwụ nwunye Izikiel 
 15 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,  16 “Nwa nke mmadụ, ana m aga iwere ihe otiti napụ gị onye ahụ ihe ya na-atọ gị ụtọ. Ma mgbe o mere, ị gaghị eti aka nʼobi maọbụ kwaa akwa. Anya mmiri agakwaghị esi gị nʼanya pụta.  17 I nwere ike sụọ ude, ma asụsila ya ike. Ị gaghị eru uju nʼihi onye nwụrụ anwụ. Kechie isi gị, yirikwa akpụkpọụkwụ gị, ekpuchila egbugbere ọnụ gị, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ na-eri.” 
 18 Agwara m ndị mmadụ okwu a nʼụtụtụ, ma nʼanyasị nwunye m nwụrụ. Nʼụtụtụ echi ya, emere m ihe niile dịka e siri nye m ya nʼiwu. 
 19 Mgbe ahụ, ndị mmadụ sịrị m, “Ị gaghị agwa anyị ihe ihe ndị a pụtara? Gịnị mere iji eme omume dị otu a?” 
 20 Ya mere a sịrị m ha, “Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m,  21 Gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga ime ka ebe nsọ m ghara ị dị nsọ, bụ ebe e wusiri ike nke unu ji na-anya isi, ihe na-amasị anya unu, nke ihe banyere ya na-atọ obi unu ụtọ. Ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom, ndị unu hapụrụ ga-ada site na mma agha.* 24:21 Ga-anwụ site na mma agha  22 Mgbe ahụ, unu ga-eme dịka m mere. Unu agaghị ekpuchi egbugbere ọnụ unu, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ kwesiri iri.  23 Ihe ikechi isi unu ga-adịgide nʼisi unu, akpụkpọụkwụ unu ga-adịkwa nʼụkwụ unu. Unu agaghị akwa akwa maọbụ tie aka nʼobi, kama unu ga-ata ahụ nʼihi mmehie unu, sụkwaa ude nʼetiti onwe unu.  24 Izikiel ga-abụrụ unu ihe ịmaatụ. Unu ga-emekwa dịka o mere mgbe ihe ndị a mezuru. Unu ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.’ 
 25 “Ma gị, nwa nke mmadụ, nʼụbọchị ahụ m napụrụ ha ebe ha siri ike, nke bụ ọṅụ ha na ebube ha, na ihe anya ha na-achọsi ike; na ihe na-atọ obi ha ụtọ, na ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom,  26 nʼụbọchị ahụ, ọ bụ onye na-agba ọsọ ndụ ga-agbakwute gị ịkọrọ gị ihe mere.  27 Nʼoge ahụ, ị ga-asaghe ọnụ gị. Gị na onye ahụ na-agba ọsọ ndụ ga-ekwurịta okwu. Ị gaghị anọkwa juu ọzọ. Nʼihi ya, ị ga-aghọrọ ha ihe ịrịbama. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”