Abụ Ọma 136
Abụ ekele 
 1 Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma. 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 2 Keleenụ Chineke kachasị chi niile elu. 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 3 Keleenụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile. 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 4 Keleenụ onye ahụ naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche, 
ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 5 Keleenụ onye ahụ ji nghọta ya kee mbara eluigwe niile, 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 6 Keleenụ onye wuru ụwa nʼelu ogbu mmiri, 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 7 Keleenụ onye ahụ kere anyanwụ na ọnwa, 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 8 Onye mere anyanwụ ka ọ na-acha nʼehihie, 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 9 Onye mere ka ọnwa na kpakpando na-achị nʼabalị, 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 10 Onye ahụ tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼIjipt, 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 11 O duuru ndị Izrel site nʼIjipt pụta, 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 12 O ji aka ya dị ike nke o setịpụrụ esetipụ dupụta ha; 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 13 Onye ahụ kewara Osimiri Uhie abụọ, 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 14 Onye duuru ndị Izrel gafee nʼetiti ya, 
nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 15 Ma Osimiri Uhie riri Fero na ndị agha ya niile; 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 16 Keleenụ onye duuru ndị ya gafee ọzara, 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 17 Onye ahụ tigburu ndị eze dị ukwuu, 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 18 O gbukwara ndị eze dị ike nke ukwuu, 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 19 O gburu Saịhọn eze ndị Amọrait, 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 20 Na Ọg eze Bashan, 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 21 Were ala ha nye dịka ihe nketa, 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 22 O nyere ohu ya Izrel ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha, 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 23 Onye chetara anyị mgbe anyị na-adịghị ike, 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 24 Mee ka anyị nwere onwe anyị site nʼaka ndị iro anyị, 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 25 Ọ na-enye ihe niile dị ndụ nri, 
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 
 26 Keleenụ Chineke nke eluigwe ekele. 