Abụ Ọma 114
Abụ ncheta ngabiga 
 1 Mgbe ụmụ Izrel si nʼala Ijipt pụta, 
mgbe ezinaụlọ Jekọb sitekwara nʼebe ndị asụsụ ha dị iche pụta, 
 2 Juda ghọrọ ebe nsọ Chineke, 
Izrel ghọrọ ala ọ na-achị. 
 3 Osimiri hụrụ ya, gbaa ọsọ,* 114:3  Ọpụ 14:21 
osimiri Jọdan hụkwara ya chigharịa laa azụ† 114:3  Jos 3:12-16; 
 4 Ugwu ukwu niile wụliri elu dịka ebule; 
ugwu nta niile wụlikwara elu dịka ụmụ atụrụ. 
 5 Gịnị mere gị oke osimiri, i ji na-agba ọsọ? 
Osimiri Jọdan, gịnị na-eme gị i ji chigharịa laa azụ? 
 6 Gịnị na-eme unu, ugwu ukwu niile unu ji na-awụli elu dịka ụmụ ebule? 
Gịnị na-emekwa unu, ugwu nta niile, unu ji na-awụli elu dịka ụmụ atụrụ? 
 7 Ka ụwa niile maa jijiji nʼihu Onyenwe anyị, 
ka ọ maakwa jijiji nʼihu Chineke nke Jekọb, 
 8 onye mere ka oke nkume ghọọ ọdọ mmiri, 
onye mere ka ọmụ nkume ghọọ isi iyi mmiri.‡ 114:8  Aịz 48:21; 1Kọ 10:4 
*Abụ Ọma 114:3 114:3 Ọpụ 14:21
†Abụ Ọma 114:3 114:3 Jos 3:12-16
‡Abụ Ọma 114:8 114:8 Aịz 48:21; 1Kọ 10:4