Abụ Ọma 6
Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke e ji ụbọ akwara abụ. Nʼusoro Sheminit. Abụ Ọma Devid. 
Ekpere nʼoge nsogbu 
 1 O Onyenwe anyị, abarala m mba mgbe ị na-ewe iwe. 
Atala m ahụhụ nʼoge ọnụma gị. 
 2 Biko, meere m ebere Onyenwe anyị, nʼihi na adịghị m ike. 
Gwọọ m, nʼihi na ọkpụkpụ m niile nọ nʼihe mgbu. 
 3 Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ihe mgbu. 
Ruo ole mgbe, O Onyenwe anyị, ka ị ga-anọgide na-agba m nkịtị? 
 4  Onyenwe anyị, biko, bịa zọpụta m; 
nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ, napụta m. 
 5 Nʼetiti ndị nwụrụ anwụ ọ dịghị onye na-ekwupụta aha gị. 
O nwere onye na-eto gị site nʼala ili? 
 6 Ike agwụla m nʼihi ịsụ ude. 
Abalị niile, ana m eji ịkwa akwa mee ka ihe ndina m jupụta na mmiri, 
ana m eji anya mmiri dee ihe ndina m. 
 7 Anya m adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ihe mwute; 
ọ kaala nka nʼihi mmeso ndị iro m. 
 8 Sitenụ nʼebe m nọ wezuga onwe unu, unu ndị na-eme ajọ ihe, 
nʼihi na Onyenwe anyị anụla akwa m niile. 
 9  Onyenwe anyị anụla akwa m; ọ nụla arịrịọ nke m na-arịọ ya ka o meere m ebere. 
Ọ nabatala ekpere m. 
 10 Ka ndị iro m niile bụrụ ndị ihere ga-eme. 
Ha ga-ada mba, bụrụkwa ndị ga-eji ihere laghachi ebe ha si bịa.