2
Ninive ga-ada 
 1 Onye na-ebuso gị agha na-abịakwasị gị. 
Chee ebe gị niile e wusiri ike nche. 
Chee ụzọ niile nche, 
mee ka ụkwụ gị sie ike nʼala. 
Chịkọtakwa ike gị niile. 
 2  Onyenwe anyị ga-eme ka ịma mma Jekọb laghachi, 
dịka ịma mma nke Izrel 
ọ bụ ezie na ndị mbibi ebibiela ha, 
lakwaa alaka osisi vaịnị ha niile nʼiyi. 
 3 Ọta ndị agha ya na-acha ọbara ọbara, 
ndị bụ dike nʼagha yikwa uwe na-acha uhie uhie. 
Igwe e ji wuo ụgbọ agha na-egbu amụma 
nʼụbọchị ahụ ha na-ejikere agha, 
otu a kwa, ha na-efegharịkwa ùbe ha eji osisi fịa mee. 
 4 Ụgbọ agha na-eme mkpọtụ dị ukwuu nʼezi, 
ha na-agbagharị ihu na azụ nʼama niile. 
Ha na-enwu dịka ire ọkụ, 
na-agbagharịkwa dịka amụma. 
 5 Ọ na-akpọkọta ndị agha ya a zụziri azụzi, 
ma ha na-asọ ngọngọ nʼije ha. 
Ha ji ọsọ gbaga ruo nʼelu mgbidi ha, 
dozie ọta nche ha niile nʼusoro. 
 6 Ma e megheela ọnụ ụzọ ama nke osimiri, 
ụlọeze na-amakwa jijiji. 
 7 E nyela ya ka ọ bụrụ iwu na obodo a 
aghaghị ịbụ obodo a dọtara nʼagha. 
Ndị ohu ha ndị inyom so ha nʼazụ na-akwa akwa dịka nduru, 
na-etikwa aka nʼobi. 
 8 Ninive dịka ọdọ mmiri 
nke mmiri ya na-ehifusị. 
“Kwụsị! Kwụsị!” ka ha na-ebe, 
ma ọ dịghị onye ga-ele anya nʼazụ. 
 9 Kwakọrọnụ ọlaọcha, 
kwakọrọnụ ọlaedo dịka ihe a kwatara nʼagha. 
Akụnụba dị nʼụlọakụ ya na ihe ndị ọzọ bara uru nʼobodo ahụ, 
enweghị ọgwụgwụ. 
 10 E bibiela ya. A gbahapụla ya, hapụ ya ka ọ tọgbọrọ nʼefu. 
Obi ndị nọ nʼime ya na-alọ mmiri, ikpere ha niile na-ama jijiji, 
anụ ahụ ha niile na-amakwa jijiji, ihu niile achagharịakwala. 
 11 Ebeekwa ka ọgba ọdụm ahụ dị ugbu a, 
bụ ebe ahụ ha na-anọ enye ụmụ ha nri, 
ebe oke ọdụm na nne ọdụm na-ejegharị, 
na ebe ụmụ ọdụm na-anọ na-atụghị egwu ihe ọbụla? 
 12 Ọdụm ahụ na-adọgbu anụ na-ezuru ụmụ ya, 
nke na-anyagburu nne ọdụm anụ, 
na-ekpoju anụ ọ dọgbutara nʼụlọ ya niile. 
Ebe obibi ya jupụtara nʼanụ ọ dọgburu. 
 13 “Edoola m onwe m imegide gị,” 
otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri, 
“Aga m esure ụgbọala gị niile nʼanwụrụ ọkụ, 
mma agha ga-ala ụmụ ọdụm gị niile nʼiyi. 
Agaghị m ahapụkwara gị anụ ọbụla ị ga-adọgbu nʼụwa. 
A gaghị anụkwa 
olu ndị ozi gị ọzọ.”