14
Nchegharị na ngọzị 
 1 Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke unu, unu ndị Izrel; 
nʼihi na ọ bụ mmehie unu wetaara unu ịsọ ngọngọ. 
 2 Chịrịnụ okwu nʼọnụ unu 
lọghachikwute Onyenwe anyị. 
Gwanụ ya sị, 
“Gbaghara mmehie anyị niile, 
jirikwa ihuọma nabata anyị, 
ka anyị si otu a jiri egbugbere ọnụ anyị chụọrọ gị aja. 
 3 Ndị Asịrịa enweghị ike ịzọpụta anyị, 
ọ bụghị nʼelu ịnyịnya agha ka anyị ga-anọkwasị. 
Anyị agaghị asịkwa ‘Chi anyị ka unu bụ’ 
nye ihe ndị ahụ anyị jiri aka anyị pịa, 
nʼihi na nʼime gị, ka ndị na-enweghị nne na nna na-achọta obi ebere.” 
 4 “Aga m agwọ ndaghachi azụ ha, 
jiri obi m niile hụ ha nʼanya, 
nʼihi na iwe m esitela nʼebe ha nọ chigharịa. 
 5 Aga m adịrị Izrel dịka igirigi. 
Ọ ga-amakwa ifuru dịka okoko lili. 
Dịka osisi sida nke Lebanọn, 
mgbọrọgwụ ya ga-abami nʼime ala; 
 6 ome ya ga-awasa, 
ịma mma ya ga-adịkwa ka osisi oliv, 
isisi ọma ọ na-esi ga-adị ka isi osisi sida nke Lebanọn. 
 7 Ha ga-ebi nʼokpuru ndo m. 
Ha ga-etolite dịka osisi ọka dị ndụ. 
Ha ga-ama ifuru dịka osisi ubi vaịnị, 
a ga-amatakwa ha nʼebe niile dịka e si mara mmanya e mere na Lebanọn. 
 8 Gị Ifrem, gịnị ka mụ na arụsị nwekọrọ? 
Mụ onwe m ga-aza ya, ma lekọtakwa ya. 
Mụ onwe m dịkwa ka osisi junipa dị ndụ. 
Ịmị mkpụrụ gị na-esitekwa nʼebe m nọ abịa.” 
 9 Onye bụ onye amamihe? Ha ga-aghọta ihe ndị a. 
Onye bụ onye nwere uche nghọta? Ha ga-aghọta ihe ọ pụtara. 
Nʼihi na ụzọ Onyenwe anyị bụ ezi ụzọ. 
Ndị ezi omume na-ejekwa ije na ha, 
ma ndị na-enupu isi na-asọ ngọngọ nʼime ha.